Winnie Madikizela-Mandela: Onye ka nwaanyị a bụ?

Winnie Mandela Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Winnie mụtara ụmụ abụọ oge ya na Nelson Mandela bụ di na nwunye

N'agbanyeghị na alụmdinanwunye ya na Nelson Mandela mechara gbasaa n'afọ 1992, Winnie nọrọ chịm n'ime ndụ di ya - soro ya pụta n'ụlọmkpọrọ, ha abụọ jidere aka n'afọ 1990 ka Mandela nọchara afọ 27 n'ụlọmkpọrọ.

A maara ya na Mandela (a na-etu Madiba) dịka ndị na-alụ ọgụ megide ịkpa oke agbụrụ n'ime ihe ruru afọ iri atọ.

Winnie ka bụ nwaagbọghọ nọ na mbido afọ 20 oge ọ pụtara ihe n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, mana n'afọ ndị sotere ya, o mechara bụrụ onye a na-enyo enyo gbasara ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị.

Oge ọ dị ndụ, Winnie so n'otu ndị bidoro otu pati ọchịchị ndị Saụt Afrịka bụ ANC.

Akụkọ ga-amasị gị

Ọnụ na-ekwuchitere ezinaụlọ ya bụ Victor Dlamini kwuru na Oriakụ Mandela "nwụrụ n'udo ebe ezinaụlọ ya gbara ya gburugburu n'ehihie taa bụ Mọnde" ka ọ rịatechara ọrịa aka.

Ihe ndị ọzọ gbasara Winnie Mandela

A mụrụ Winnie n'afọ 1936 na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Cape nke a mabu dịka Transkei.

Ọ mụrụ ọrụ dịka onye ọrụ ebere nke bekee kpọrọ social worker, ma zute Nelson Mandela mechara bụrụ di ya n'afọ 1950.

Ha biri dịka di na nwunye afọ iri atọ na asatọ (38).

Winnie so di ya buso ịkpa oke agbụrụ agha ihe ruru afọ iri atọ, n'agbanyeghị na ha abụọ anọkọghị ọnụ oge ọbụla maka na Mandela nọ n'ụlọmkpọrọ.

Ọ lụrụ agha a ọfụma mere e ji mara ya ọfụma na gburugburu ụwa dịka onye ọnụ siri ike gbasara ya.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Winnie Mandela n'ihu ụlọikpe ụbọchị amara Mandela ikpe nga mkpụrụ ọka

Dịka di ya bụ Nelson Mandela, Winnie mechara gaa ụlọmkpọrọ maka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'etiti ha na ndị ọcha na-achị Saụt Afrịka mgbe ahụ.

Emechara kpọọ ya aha ọjọ maka ụfọdụ ihe ndị o mere, dịka oge ọ kwadoro ihe bekee kpọrọ "necklacing" bụ ka a na-anyanye ndị a na-enyo enyo ịbụ ndị mgbaama taịa moto n'olu, n'ebe afọ 1980.

Ha bokwara ya ebubo ịtọ mmadụ, ma maa ya ikpe ịga nga afọ isii oge a sị na aka ya dị n'ọnwụ otu nwata onye oyiegwu aha ya bụ Stompei Seipei dị afọ iri na anọ (14); ọ gọrọ ebubo ndị a.

N'agbanyeghị na Mandela kwudosiri ike n'akụkụ ya ka a na-ebo ya ebubo a, alụmdinanwunye ha mechara gbasaa ka afọ abụọ gachara ka o si na mkpọrọ pụta.

Ọ kwụsịghị ịza aha Mandela ma bụrụkwa ezigbo enyi ya, n'agbanyeghị na ọ gbara ya alụkwaghịm n'ụlọikpe n'afọ 1996.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Winnie na Madiba ụbọchị o si na mkpọrọ pụta

Ndị kwuru okwu maka ọnwụ ya

Cyril Ramaphosa bụ onyeisiala Saụt Afrịka kwuru "dịka mama Winnie si nwụọ ugbua, otu onye n'ime ndị anyị ji eme ọnụ anwụọla. O so na ndị na-agwa anyị ka o si dị, anyị agaghị echefu nduzi ya."

Desmond Tutu riturula n'ọkwa ọchịchị Archbishop kwuru sị "obiike ya ba etu o siri kwudosie ike n'ọgụ mmegide ịkpa oke agbụrụ bụ ihe ịkpalite mmụọ nye m na ọtụtụ ndị na-alụ ọgụ maka ike dịịrị onye."

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a