Ndị uweoji na-achọ nwoke gburu nwa ya n'Enugwu

Ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu Image copyright EnuguPolice/Facebook

Ndị uweojii n'Enugwu ekwuola na ha na-achọ otu nwoke enyere aha ya dịka Onyenwe Offor Ajah echere na o gburu nwa ya nwoke maka esemokwu ezinaụlọ.

Onye na-ekwuchite ọnụ ndịuweojii n'Enugwu Ebere Amaraizu kwuru ụnyaahụ na nke a mere n'Ameke Enu dị n'agba Aninri n'Enugwu steeti.

Enyele aha nwoke e gburu ka Kenneth Ajah dị afọ 38, onye ya na nna ya na-aba mba tupu o were ihe kụọ ya n'isi

Kenneth dara n'ala mgbe nna ya mere nke a, e we buru ya gaba ụlọọgwụ.

Ọ nwụrụ mgbe otu onye dọkịta n'ụlọọgwụ ahụ mechara ya nyocha.

E burula ozu ya gaba ụlọ nchekwa ozu ebe ndịuweoji jisike achọ Onyenwe ma na-ekwe nkwa na ha ga-anwụchi ya ma kpe ya ikpe.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara