'Mahadum Covenant kpụrụ ụmụakwụkwọ isi dara iwu'

Ụmụagbọchọ na-ese foto Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ụmụakwụkwọ mahadum ahụ enweghị ikike iji ekwenti ga ebe ahụ

Ndị mmadụ jisike na-egosi iwe ha n'elu atụmatụ mgbasa ozi nke a kpọrọ Twitter maka akụkọ pụtara ebe otu mahadum bu Covenant kpụrụ ụmụakwụkọ ha isi.

Ụmụakwụkwọ a na-ekwu na ihe kpatara eji kpụ ha isi bụ maka na ha ejighi akwụkwọ nsọ ga na chapụl ha n'ime ụlọakwụkwọ ahụ.

Otu onye ọkaikpe bụ Precious Nwankwo gwara BBC Igbo na ndị isi n'ụlọakwụkwọ ahụ dara iwu na-ahụ maka nchekwa oke ruru mmadụ.

Gee ntị ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Mahadum Covenant kpụrụ ụmụakwkwọ isi dara iwu'

Otu onye si na mahadum ahụ pụta achọghị ka-enye aha ya sị na nke a bụ obere ihe n'ihe ndị ọzọ mahadum ahụ na-eme ụmụakwụkwọ ha.

Ọ sị: "mahadum ọ bụla nwere ihe dị njọ na ihe dị mma maka ya, nke a a gaghị a pụ iche".

Mbọ BBC gbara inweta Mahadum Covenant ka ha sa ebubo amịtaghị mkpụrụ.

Mgbe onye ntaakụkọ BBC kpọrọ onye registra madadum n'ekwenti, o kwuru na ya enweghị ọsisa ọbụla.

Nwata akwụkwọ ochie ahụ kwukwara na ụmụakwụkwọ ahụ kwesiri ị wetu obi gụọ akwụkwọ si ebe ahụ pụọ.

Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu social media gbasara akụkọ a:

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara