'Aguleri na Igbo Ukwu abụghị mbido Ndigbo' - Eze Nri

Mmanwụ bụ otu njirimara Ndigbo
Eze na-achị Nri bụ Ichie Emelie Okika adọọla obodo Aguleri na Igboukwu aka na ntị ka ha kwụsị ịzọ onye bụ isi mbido Ndigbo niile.
Okika kwuru kusie ike na ọ bụ Nri bụ ebe Ndigbo siri pụta, ma kwukwa n'ihe gbasara isi mmiri Ndigbo bụ okwu mmuọ na e kwesịghị iji mee ihe ndọrọndọro ọchịchị.
Ọ bara obodo Aguleri n'Igbo Ukwu mba maka mbọ ha na-agba idegharị akụkọ mbido ala Igbo, ma gwa ha ka ha wepụ aka enwe n'ofe ka iwe ghara iwe ndị chi e nwere.
O kwuru sị "Ọ bụ eziokwu na anyị na ndị Aguleri bụ otu mana ihe dị iche bụ na agụ ndọrọndọrọ ọchịchị dị be ha. Igboukwu abịadịghị nso n'ihe gbasara akụkọ a".
Okika sị na Eri bụ nna ala Igbo niile si ala Israel mapụta bụ ọkpara nke ise Gad bụ nwa asaa nke Jacob. Nakwa Eri na ndịotu ndịọzọ sị ala Egypt pụta njem tupu ọpụpụ ndị ala Israel n'Egypt.
O sị "Ha mere njem n'elu mmiri ma rue ebe mmiri Omambala na Ezu zuru onwe ha a na-akpọ 'Agbanabo' dị n'obodo Aguleri ebe mmụọ na-edu ha sị ha kwụsị rụọ obodo'.