Ghana: Ọdịda ogige nwupụta ọlaedo egbuola mmadụ isii

Enwela ọtụtụ ihe mberede n'ogige ngwupụta ọlaedo na Ghana. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Enwela ọtụtụ ihe mberede n'ogige ngwupụta ọlaedo na Ghana.

Ụlọọrụ ebe a na-egwupụta ọlaedọ dị na mpaghara ndịda nke mba Ghana adaala, gbuo mmadụ isii ma merụọ mmadụ abụọ ahụ.

Ihe mberede a mere na Brong Ahafo nke dị kilomita narị anọ na iri atọ (430) site n'isi obodo bụ Accra mgbe a na-agbanwe elu ọwara ochie dị n'ụlọọrụ ahụ bụ nke daara ada.

Ndị nwe ogige ngwupụta ọlaedo ahụ bụ otu ụlọọrụ dị na mba Amerịka akpọrọ Newmont bụ ndị kachasị na mmepụta ọlaedo n'ụwa.

Ndị merụrụ ahụ bụ ndị ọrụ Consar Limited bụ ndị ji ọrụ ị gbanwe elu ọwara ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ ahụ bụ Agbeko Azumah kwuru " A na-ekwupụta ọnwụ mmadụ isii, abụọ ndị ọzọ bụ ndị agwọrọla n'ụlọọgwụ ma sị ha lawa mgbe ihe a mechara na satọde."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Osote onyeisi ụlọọrụ ahụ n'Afrịka bụ Alwyn Pretorius kwuru " Ụlọọrụ Newmont niile nọ na mgbagwoju anya n'ihe mberede a.

Ihe kachasị mkpa ugbu a bụ ikwado ezinaụlọ, ndị enyi n'akwa ndị ọrụ ndị a nwụrụ anwụ."

Ụlọọrụ a akwụsịla ọrụ n'ebe ahụ ma chụpụ ndị ọrụ ya, dịka nyocha ka na-aga n'ihu.

"Ndị uweojii na ndị nọ n'ebe ahụ, e meela ka ndị ọrụ gọọmentị gụnyere ndị na-ahụ maka akụnaụba dị n'ala mara maka nke a," Pretorius kwuru.

Isiokwu Ndị Emetụtara