Lee ngwaagha ndị uweojii Naịjirịa napụtara ndị mmadụ

Jimoh Moshood dịka ọ na-egosị ngwaagha ndị akpachiri
Nkenke aha onyonyo Jimoh Moshood dịka ọ na-egosị ngwaagha ndị akpachiri

N'ọnwa Febụwarị onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris nyere ndị kọmishịọna ndị uweojii Steeti niile iwu ka ha kpachie egbe, mgbọ nakwa ngwaagha nke dị n'aka ndị nchekwa ọdịnaala, ndị na-achị ehi, ndị ọrụ ubi na ndị nille na-eji ngwagha n'ụzọ na-ezighị ezi.

N'ihi nke a, ndị ọrụ ọtawaike nke ndị uweojii hiwara malitere ọrụ n'ịchịkọta, ịkpachị nakwa nweghachị ngwaagha, egbe na mgbọ nke dị n'aka ndị na-ekwesighị ekwesi gụnyere ndị omeka ome.

Ha mere nke a site na i nyocha, na nzaacha ebe nzuzo dị icheiche e zoro ngwaagha ndị ahụ site n'akụkọ kepukepu ha nụrụ.

Ngwaagha ndị kpachiri:

  • Egbe akpọrọ GPMG (General Purpose Machine Gun) dị abụọ
  • Egbe akpọrọ AK47 dị otu narị na iri na anọ
  • Egbe akpọrọ SMG dị asatọ
  • Egbe ndị ọzọ dị icheiche dị narị atọ na otu.

Ngwaagha niile a dị narị anọ na iri abụọ na ise, agbanyeghị na-agbatị kwuola ohere enyere ndị mmadụ ịwụsa ngwaagha ha n'aka ndị uweojii rue ụbọchị iri abụọ na otu.

E hịwara mkpachị na mkpochapụ ngwaagha ndị a iji nyere ndị uweojii aka igbochi ọgụ dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ubi, ntọọrọ mmadụ, izu ohi, iyi ndụ egwu na ihe ndịọzọ.

Nkenke aha onyonyo Mgbọ egbe dị icheiche so na ngwaagha ndị akpachiri

Dịka ọ ka na-aga n'ihu, ndị uweojii agwala ndị mmadụ ka ha mee ka ndị uweojii mara maka onye ọ bụla ji ngwaagha n'ụzọ na-ezighiezi nke megidere iwu 'Firearms Act'.

"Ndị uweojii a naghị ala azụ na nkwa ha ichekwa ndụ na akụnaụba ndị mmadụ na Naịjirịa" Jimoh Moshood bụ onye na-ahụ maka mmerikọta ndị uweojii na ndị ọdịnala kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a