Ihe ruru mmadụ 257 anwụọla na mberede ụgbọelu n'Algeria

Ụgbọala kpọkasịrị Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ụgbọala ahụ kpọkasịrị ka ọ bere oge o ji felie elu gafere

Ndị ọrụ mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa n'Algeria kwuru na ihe ruru mmadụ 257 nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu ndịagha mere taa.

Ha kwuru na ndị ahụ nwụrụ nọ n'ụgbọelu na-ebu ndị agha tupu ụgbọelu ahụ akpọkasịa taa.

Ọtụtụ ndị nwụrụ bụ ndị ọrụ agha na ezinaụlọ ha. Mmadụ iri bụ ndị na-arụ ọrụ n'ụgbọelu ahụ.

Amabeghị ihe butere ụgbọelu a ji kpọkasịa, mana onyeisi na-achịkọta ndị agha enyela iwu sị nyochapụta ihe butere mkpọkasị a.

Nke a bụ mkpọkasị ụgbọelu kacha gbuo mmadụ kamgbe Julaị 2014, oge mmadụ 298 nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu Malaysian Airlines nke MH17, oge agbaturu ya na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Ukraine.

Ọ bụkwa mkpọkasị ụgbọelu nke abụọ kacha gbuo ndị mmadụ kamgbe afọ 2003.

Ndị ọrụ gọọmentị na-agba mbọ ịhụ na achọpụtara ndị nwụrụ.

A na-ahụ ka ahụrụọkụ si n'ụgbọelu ahụ apụta.

Ụgbọelu ahụ bụ nke Ilyushin Il-76, nọ na-aga obodo Bechar dị na mpaghara ọdịda-anyanwụ Algeria tupu ihe mberede a emee.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a