Ụlọikpe achụpụla osote onyeisi omeiwu Delta steeti

Friday Osanebi Image copyright Delta state House of Assembly
Nkenke aha onyonyo Friday Osanebi dị afọ iri atọ na asatọ bụ onye pekarịchara mpe n'afọ n'ụlọomeiwu ndị Delta steeti

Ụlọikpe ukwu dị na Kwale, achụpụla Friday Osanebi bụ osote onyeisi omeiwu nke Delta steeti.

Ha kwuru na ha chụpụrụ Osanebi na-anọchite anya ndị Ndokwa East, maka na ọ tụrụ asị banyere onye obodo ọ bụ.

Nchụpụ a na-abịa n'agbanyeghị na ọ nọọla n'ọnọdụ osote onyeisi omeiwu afọ atọ.

Ọkaikpe V. I Ofezi, gwara ndị Inec ka ha were ọsọ were ije napụta asambodo mmeri ha nyere Osanebi.

O kwuru ka ha nye Emeke Odegbe bụ onye otu Pdp ahọpụtara n'ụzọ ziri ezi na ntuliaka 2015 asambodo ahụ.

Osanebi nyere ọkaiwu ya ikike iji gbaghaa ikpe a.

Ọnụ na-ekwuchitere Osanebi bụ Agbanishi Obinne, gwara ndị ntaakụkọ na ụjọ atụla ha, na Osanebi gbadoro anya nakwa na-agba mbọ igbanwe ndụ ndị ọ na-anọchite.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a