Gịnị mere akwụkwọ eji amaonye ndị Naịjirịa?

Ndị na-achọ ị denye aka n'akwụkwọ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo NIMC kwuru na ugbua sọọsọ ndị dere aha n'afọ 2012 na 2013 bụ ndị a ga-enye akwụkwọ eji amaonye

Iwu pụtara n'afọ 2007 kwuru na onye Naịjiria dị afọ iri na isii were gawa ga-enwe akwụkwọ njiamaonye.

Maka ihe a, gọọmentị etiti mapụtara ngalaaba a kpọrọ National Identity Card Commision na bekee, maka ihu na onye ọbụla bụ nwaafọ Naịjiria nwere akwụkwọ njiamaonye a.

Mana kemgbe e wepụtara ụlọọrụ a, ọtụtụ ndị Naịjirịa enwebeghị akwụkwọ a.

Mgbọ nịịle BBC mere ịkpọ ụlọọrụ amịpụtaghị mkpụrụ makana akara ha anaghị agaaga.

Ihe ndị Naijirịa na-ekwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gịnị mere na ọbụghị onye ọbụla ga-enwe akwụkwọ a

BBC Igbo na ụfọdụ ndị Naịjirịa nwere mparịta uka, ha gwara anyị ihe agabigara oge a na-achọ ị nweta akwụkwọ eji amaonye a.

Bridget Chigbufue biri na Lagos gwara anyi na ya ata ezigbo ahụhụ. O kwuru na: "Mgbe m dere aha m, n'akwụkwọ a, a gwara m, na o ga-eru ọnwa abụọ, mana o ruola afọ ise enwebeghị m akwụkwọ a"

Oluchi Okwuone biri na Bini kwuru na ha enwebeghị ọtụtụ ụlọọrụ National Identity Card Commision na steetị ha. N'ọnụ okwu ya: "Oge ọbụla ị bịara ụlọọrụ ha, ị ga-ahụ ọtụtụ mmadụ ka nkụ, ihe a na-bọọ ụme."

Nnamdi Ojiego biri na Owerri gwara anyị na mpụ na aghụghọ ebieela omume a. O kwuru na: "ọtụtụ n'ime ndị a, na-echọ onye ga-enye ha ego"

O kwukwara na enweghị ọkụ bụ ihe ọzọ na-ebute nsogbu na ọrụ a. Ojiego kwuru na: "ọtụtụ oge ị bịara ebe a, anaghị enwe ọkụ, ịhea na-eme ka ị denye aha n'akwụkwọ anaghị aga ọsịsọ."

Isi ruo ọdụ n'akụkọ akwụkwọ eji amaonye a

Ọ bụ na n'afọ 1977 ka echiche ị mụpụta akwụkwọ eji amaonye buru isi bata n'obi gọọmentị.

N'afọ 2003, ụlọọrụ akporo National Civic Registration na bekee bidoro ị debe aha mmadụ n'akwụkw. Ha kwuru n'oge ahụ a dere aha mmadụ nde 54. Mana ebubo mpu na aghụghọ mebi omume a.

Ọ bụ n'afọ 2010, ka ngalaaba ọhụrụ a akpọrọ National Identity Card Commision bidoro ọrụ nke ha.

Onye na onye derela aha ha n'akwụkwọ a

Ugbua, dịka ozi NIMC wepụtara n'ọnwa Maachị 2018 si kwu, e debanyela aha mmadụ nde iri atọ n'akwụkwọ njiamaonye.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: