EFCC anwụchiela Sinetọ Nwaoboshi, Jang

EFCC Image copyright EFCC
Nkenke aha onyonyo EFCC na-enyo Pete Nwaoboshi bụ onye na-eso gọvanọ chịbụrụ Delta Steeti bụ James Ibori kemgbe afọ abụọ

Ngalaba gọọmenti na-alụ ọgụ megide mpụ na mmerụaka nke a na-akpọ EFCC anwụchiela onye na-anọchite anya Delta-North n'ụlọomeiwu nke ukwu bụ Sinetọ Pete Nwaoboshi, maka ebubo imefu ijeri naira isii.

EFFC bidoro inyo Nwaoboshi, ka ndị mmadụ degaara ha akwụkwọ mkpesa banyere ya nke gunyere ebubo na o nyere ụlọọrụ iri na ise ndị a na-ekwu bụ nke ụmụnne ya na ndị enyi ya nwe, ma bụrụkwa ụlọọrụ aha ha adịghị n'akwụkwọ nke gọọmentị ọrụ ngo ruru N3,483,144,000, maka ịzụ oche n'ụlọakwụkwọ dị na steeti dị na Niger-Delta.

A na-ebokwa Nwaoboshi ebubo na o mefuru ijeri naira 1.2 bụ ego ebitere ụlọakụ, ma zụkwaara Delta steeti ngwaọrụ ochie n'ọnụ nke ọhụrụ.

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwujaren gwara ụlọakụkọ Punch na ha nwụchiri nwa amadi a n'ezie ma kwukwaa na a nwụchiri ya na ngwụcha izuụka.

N'akụkọ yiri ibe ya, EFCC nwụchikwara onye chịburu Plateau steeti n'oge gara aga bụ Jonah Jang, maka ego ha sị na o mefuru oge ọ nọ n'okwa ọchịchị nke ruru ijeri naira iri.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a