'Onyenkuzi kwadara m n'ule maka na ekweghị m"

OAU Image copyright OAU Facebook page
Nkenke aha onyonyo OAU bụ madadum dị n'ọdịda-anyanwụ Naijiria a mara ọfụma

Nwaakwụkwọ Obafemi Awolowo University nọ n'okwu ebubo onyenkuzi chọrọ ịdina nwakwụkwụ ya iji kwalite ya ka ọ gafee n'ule agwala kọmitii na-enyocha okwu ahụ na Prof. Richard Akindele ma ama kwada ya n'ihi na ya jụrụ ime ihe o kwuru.

Okaiwu na-ekwuchitere nwata nwaanyị ahụ bụ Abiola Akinyode-Afolabi, kwupụtara nke a gwa ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuusde ka ha pụctachara n'ọgbakọ nke kọmịtị ahụ hiwere n' ụlọ akwụkwọ ahụ.

Na nsonso a, nwaakwụkwọ ahụ zipụrụ akụkọ dị n'igwe e ji amịta okwu (recorded audio) na soshal midia nke gosipụtara olu Akindele ka ọ na-amanye nwakwụkwọ ahụ ka ya na ya dina iji gafee ule.

Akinyode-Afolabi gwara ndị ntaakụkọ na nwakwụkwọ ahụ kọrọ ya n'uju ihe mere n'etiti ya na onyenkuzi ya, na ya enweghị pasent 33 kama na ọ bụ maka na ya ekweghị ịdina onyekụzị ahụ mere o jiri kwada ya.

Ọ gara n'ihu kwupụta na ya kpesara ndị nkuzi ndị ọzọ mana o nweghị ihe ha mere.

Akụkọ ga-amasị gị:

Cheta na abalị ole na ole gara aga, mahadum OAU kwụsiri Akindele bụ onyenkuzi na ngalaba nlekọta na ọnụgụgụ nke a kpọrọ Management and Accounting Department na bekee, iji nye ohere ka e meecha nnyocha zuru oke banyere ebubo na ọ gwara nwaakwụkwọ ya dịna ya iji gafee ule.

Kemgbe akụkọ ahụ na-efegharị, Akindele enyebeghị ọsịsa ọbula nnye ọha na eze.

Image copyright OAU Facebook page
Nkenke aha onyonyo Umụakwụkwọ OAU na-ekwu na Akindele na-akpabu ụdí akwa mbụ