Onyeisiala Buhari ga-aga Amerịka maka ọgbakọ ya na Trump echi

Buhari Image copyright NGR President / Twitter
Nkenke aha onyonyo Ọgbakọ a bụ onyeisiala mba Amerịka kpọrọ ka ha nwee ya

Onyeisiala Muhammadu Buhari na onyeisiala mba Amerịka ga-enwe ọgbakọ ụbọchị Mọnde 30 Epreel.

Ọgbakọ ahụ ga-elebe anya n'etu a ga-esi hazie mmekọrịta dị n'etiti mba abụọ ahụ nakwa itinye uche na ihe gbasara mba abụọ ahụ dịka ikwalite akụ na ụba obodo, iluso ndị oyi egwu ọgụ na ndị na-echere udo na nchekwa obodo aka ngba.

Ha ga-enwe ọgbakọ ahụ n'ehihie, e mesia, Buhari ga-enwe ọgbakọ ọzọ n'etiti ndị mara ihe ekwe na-akụ gbasara ọrụugbo na imepụta ihe.

Ndị isi gọọmenti Naịjirịa n'akụkụ ọrụugbo na njem ala na nke elu na ndị ụlọ ọrụ ndị mba US emeela ọgbakọ tupu Buhari agawa.

Ndị Naịjirịa na ndị Boeing bụ ndị kachasị emepụta ụgbọelu n'ụwa niile ga-enwekwa ọgbakọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: