Steeti 17 enweghị ego n'akpa

Mapụ Naijiria
Nkenke aha onyonyo Steeti 17 bụ udu gbara chakoo

Nchọpụta nke Economic Confidential mere gosịrị na ihe ruru ọkara steeti dị na Naijiria enweghị ego n'akpa ha a ga-akpọ ego ha nwetara onwe ha , ebe ọ bụ sọọ ego sị n'akpa gọọmentị etiti eku ume.

Economic Confidential bụ ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ wepụtara ngụkọ ka steeti siri kwụrụ na mkpata ego onwe ha nke a kpọrọ Annual States Viability Index (ASVI) na bekee nke gọsịrị na steeti iri na asaa bụ ụkwa mkpụrụ adịghị n'ihi na ego ha nwetara onwe ha erughị pesentị iri ihe ha na-eketa n'akpa gọọmentị etiti.

Ngụkọ nke Economic Confidential mere gosịrị na ewepụ ego ha na-anata n'aka gọọmenti etiti kwa ọnwa nke sitere n'ire mmanụ agbịdị, steeti ndị a agaghị na-eku ume ma ya fọdụ ịdị ndụ.

Ego steeti na-enwetara onwe ha nke a kpọrọ IGR n'aha ịchafụ na-esite na ụgwọ-isi ndị ọrụ, ụtụ okporoụzọ na kwa ego ndị mịnịstrị na ngalaba gọọmentị na-anata.

N'afọ 2017, Legos bụ steeti kachasị nweta ego onwe dịka o nwetara ijeri naịra 333 (N333Bn) nke ka ego steeti iri atọ (30) ndị ego ha pekarịchara na-enweta ma achịkọta ego ha ọnụ.

E wepụ Legos, steeti ndị ọzọ ego ha na-enwetara onwe ha karịrị pesenti iri atọ ihe ha na-enweta n'akpa gọọmenti etiti gụnyere Ogun, Rivas, Edo, Kwara, Enugwu na Kano steeti ndị gbakọtara nweta ijeri naira 607,(N607 Bn) ebe steeti ndị ọzọ gbakọtara nweta ijeri naira 327(N327Bn).

Ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ ahụ depụtakwara ego niile steeti ọbụla natara n'akpa gọọmenti site Janụwarị rue Disemba, afọ 2017.

Akụkọ ga-amasị gị: