Ị ma na Buhari yiri Trump? Lee ụzọ anọ gosiri ya

Buhari,Trump Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari na Trump anaghị ata okwu eze

Dịka onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari mere njem ọrụ gaa mba Amerịka ka ya na onyeisiala ha bụ Donald Trump nwee mkparitaụka ọganiru obodo abụọ ahụ, ị lee anya na ndụ mmadụ abụọ ndị a, ị ga-ahụ na ha yiri onwe ha n'ụzọ dị iche iche.

Lee anya n'ụfọdụ n'ime ha:

1. Ha abụọ banyere ọchịchị na nka

Ọ bụghị akụkọ na Buhari na Trump bụ agadị abụọ na-achị mba ha, n' oge a ndị mba ụwa na-ekwu maka ndị ntọrọọbia iweghara ọchịchị obodo ha.

Ha abụọ banyere ọchịchị ka ha gbachara afọ iri asaa (70).

Buharị dị afọ iri asaa na atọ (73) n'afọ 2015 oge ọ banyere n'ọkwa ọchịchị, ebe Trump dị afọ iri asaa na otu (71) n'afọ 2017 oge ọ banyere.

2. Etu ha siri banye ọchichị yiri onwe ha

Ha abụọ banyere n'ọkwa ọchịchị ka ha merichara na ntuliaka kachasị tụọ ọha mmadụ n'anya.

Mmeri Trump meriri Hillary Clinton onye ọtụtụ ndị mmadụ chere kara ịbụ nwaanyị mbụ ga-abụ onyeisiala Amerịka, tụrụ ndị mmadụ n'anya dịka nke Buhari meriri Goodluck Jonathan onye bụ onyeisiala oge ahụ siri gbagwojuo ọtụtụ mmadụ anya.

Mgbasaozi e mere tupu ntuliaka kpọbatara ha, kpalitere ọkụ ịkpa oke agbụrụ n'ụdị ahụbeghị na nsonso na mba abụọ a, nke ka na-aga n'ihu ugbua.

3. Ha abụọ anaghị ele ndị ntaakụkọ ala ha anya ma

Ọ bụghị ihe zoro ezo na Trump ejighị anya ahụ ndị ọrụ ntaakụkọ. Ọtụtụ na-ekwu na Buhari n'onwe ya dịkwa etu ahụ.

Okweghị ndị ntaakụkọ Naijiria aghọta ihe bụ na ewepụ mkparịtaụka, Buharị na-ekwuputakarị okwu dị mkpa gbasara atụmatụ ya oge ọbụla ọ gara mba ofesi.

Kemgbe ọ banyere n'okwa ọchịchị, naanị mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ mere na Disemba 30, 2015, nke Channels TV chịkọtara, bụ okwu Buhari gwara ndị ọ na-achị n'ụlọ, ndị ọzọ bụ n'ama.

Trump n'onwe ya bụ onye ama dịka 'onye iro' ndị ụlọakụkọ ndị Amerịka. Ọtụtụ oge, ọ bụrụ na ọ naghị akpọrị CNN na Twitter ya, ọ bụrụ otu onye ntaakụkọ ka ọ na-akatọ.

A na-ebokwa ndị ntakụkọ ebubo na ha kpọrọ onyeisiala abụọ ahụ asị.

4. Ha abụọ ji okwu akusu ndị ha na-achị.

Trump na Buharị anaghị ata okwu eze tupu ha kwuo ya, nke mere ndị ha na-achị ji akpọrị ha maka ya.

Ihe ọbụla gbatara Trump n'obi ọ na-ekwupu ya n'igwe okwu Twitter. Ọtụtụ ndị Amerịka echefubeghị okwu Trump dịka; #Covfefe, 'Afrịka bụ obodo ike nsị' (#shitholecountries) wdg.

Buhari anaghịkwa ahazi okwu, n'agbanyeghị ebe maọbụ onye ọbụla nọ ebe ọ na-ekwu okwu.

Oge ọ gara Germany, Buhari gwara Angela Merkel na nwunye ya enweghị ọnụ n'okwu otu pati ya bụ APC, na ọ bụ sọsọ 'n'ọnụ ụlọ nke ọzọ' ka o nwere ọnụ okwu. Na nsonsọ a, ọ gwara ọgbakọ ndịisiala Commonwealth na ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ na-achọ nleta ahụike, ụlọ na ihe ndị ọzọ na-akwụghị ụgwọ.

Akụkọ ga-amasị gị: