Ipob: Anyị na Nnia Nwodo enweghị nsogbu ọbụla
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Ipob: Ngagharị iwe anyị bụ i gosi mba Amerịka mmegbu a na-eme anyị

Onye odeakwụkwọ ndị Ipob bụ Emma powerful ekwupụtala na ha Nnia Nwodo enweghị nsogbu ọbụla nke ga-eme ka ha wakpo ụlọ ya.

Okwu a bụ na nzaghachị aka a na-arụ na ọ bụ Ipob gbara ogbunigwe n'ụlọ Nnia Nwodo dị n'Enugwu.

Ọ gara n'ihu kwuo na Ipob ga-eme ngagharị iwe na Mba Amerịka dịka onyeisiala Buhari na Donald Trump ga-ezute onwe ha taa.

Ngagharị iwe a bụ iji gosi mba Amerịka ogbugbu Buharị na-egbu ndị otu Ipob

Ọzọkwa bụ ka ụwa tinye ọnụ ka enwe Ipob ohere ime ntuliaka mnwereronwe.