NLC sị na ha ekweghị na ndọghachiazụ n'ụgwọ opekatampe

Ndịisi NLC Image copyright NLC Blog
Nkenke aha onyonyo Ndịọrụ chọrọ ụgwọọrụ opekatampe ọhụrụ

Otu jikọrọ ndị ọrụ bụ NLC n'aha ichafụ ekwuola na ha agaghị enye ohere ka enwe ndoghazi azụ n'imezu atụmatụ iwelite ụgwọ opekata mpe oge ekwuru na aga eme ya.

Onyeisi ndị NLC bụ Ayuba Wabba kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi ndị ọtụ ahụ wepụtara na websait ha maka ncheta ụbọchị ndịọrụ, nke a kpọrọ May Day.

Gọọmentị etiti kwere nkwa ibido imezu nkwekọrịta mwelite ụgwọ opekatampe ọhụ n'agba nke atọ nke afọ.

Wabba bụ onye kwara arịrị na gọọmentị emezubeghị nkwa iwelite ụgwọ ọrụ opekatampe sị, "Anyị ga-agbalị ịhụ na oge ahụ kọmitii maka imezu ụgwọ opekatampe ọhụrụ a ga-eme dịka esiri kwuo ya na enweghị mgbanwe ọbụla.

"E kwesiri ilekọta ndịọrụ bụ ndị na-akpata akụ dịka anyị mara ọnọdụ ndịọrụ Naịjirịa ọkachasị ka ihe siri ada oke ọnụ n'ahịa."

Ọ gara n'ihu kpọkuo gọọmentị etiti ka ha lebanye anya n'okwu ezi ọchịchị obodo, enweghị ọrụ nakwa ọganihu.

Isi okwu ncheta ụbọchị ndị ọrụ nke afọ a bụ" Ọrụ dịrị otu ndịọrụ na ọganihụ ala anyị, jikere maka ilụ ọgụ, jikere imeri."

Cheta n'abalị ole na ole gara aga, Wabba dọrọ ndị steeti gọọmenti na ndị ụlọọrụ na abụghị nke gọọmentị aka na ntị sị na NLC agaghị anabata okwu nkọwa ọbụla ga-ekwu na ha enweghị ike isonye na mmezu ụgwọ ọrụ opekatampe ma a malite ya.

Akụkọ ga-amasị gị: