Mmachi Codeine: Dextromethorphan aga-ebe okwu?

Nwata nwoke na aṅụ ọgwụ ọgwụ ụkwara,copdeine
Nkenke aha onyonyo Akụkọ na-ekwu na ụfọdị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ndị ntorobịa ọgwụ a dịka ihe onyinye

Na nsote nchọpụta BBC Africa gbasara etu ndị nọ na mpaghara ugwu awụsa Naịjirịa si emebi ọgwụ ụkwara nwere codeine, gọọmenti etiti amachiela mmepụa na mbubata ọgwụ ụkwara ọbụla nwere codeine na Naịjirịa.

Mịnịsịta okwu ahụike dị n'aka bụ Isaac Adewole nyere iwu a maa kwuo ka e jiri ọgwụ ụkwara nke nwere dextromethorphan nke a na-akpọ "dextro" na nkenke nọchie nke nwere codeine.

Ugbua gọọmentị machiri mbubata ọgwụ ụkwara nwere codeine, ọ bụ dextromethorphan ka mma?

Ndị ọkammụta n'okwu ihe gbasara ahụike katọrọ ihe gọọmenti ma kwuo na dextromethorphan abụghị ọsịsa nsogbu oke ịnụ ọgwụ ụkwara nwere codeine.

BBC Igbo na dọkịnta Maruf Mustafa kwuru okwu. Ọ gwara BBC Igbo na codeine na dextro nọ n'otu ezịnaụlọ naanị na codeine ka atụ atụ karịa dextro.

O kwuru na codeine na dextro bụ obere ọgwụike a na-akpọ "Heroine" na bekee.

Mustafa kọwara na imachi mbubata codeine abụghị ihe ga-akwụsị nsogbu mmebi ya n'ihi na dextro na-eme otu ihe codeine na-eme mana dextro anaghị atụ atụ nke ukwuu.

Nyiri dị n'etiti codeine na dextro

  1. Ha abụọ nọ n'otu ezinaụlọ a na-akpọ "opium"
  2. Ha abụọ na-atụ ụra
  3. Ha abụọ na-egbu egbu
  4. Ha abụọ na-eri ụbụrụ
  5. Ha abụọ na-ala arụ ụfụ.

N'aka nke ọzọ dọkịnta Hafeez Olayire kwuru na ihe gọọmenti kwesiri ileba anya bụ etu ndị mmadụ si egote ọgwụ ma ha eweghi akwụkwọ ịnata ọgwụ.

Olayire kwuru na ndị a na-akpọ ndị famasi ekwesighi iresi ndị mmadụ na-ejighi akwụkwọ site na dọkịnta ha ọgwụ.

Ọ kwuru na ihe ga-egbo mkpa a bụ ka gọọmentị tie iwu machie ndị na-ere ọgwụ iresi ndị na-ejighi akwụkwọ site n'aka dọkịnta ọgwụ.

N'okwu ya; "Ọ bụ ihe jọrọ njọ na ndị mmadụ na-anọkata banye n'ebe a na-ere ọgwụ ga zụrụ ọgwụ na-enweghi onye na-akwụsị ya."

"Ihe a ka gọọmenti kwesiri ileba anya maka na a machigodi codeine, ndị mmaọ̄ụ ga ebido igbo dextro maka na ya na codeine nọ n'otu ezinaụlọ."

Gịnị ka ọgwụ ụkwara na-arụ?

Image copyright Chimezie Ucheagbo
Nkenke aha onyonyo A na-egote ọgwụ ụkwara na-ebe niile a na-ere ọgwụ

Dọkinta Maruf Mustafa kọwara na ụkwara abụghị ọrịa n'onwe ya mana ọ bụ ngosipụa ọrịa ọzọ dị mmadụ n'hụ.

Mana, ọgwụ ụkwara na-aga n'akụkụ ụbụrụ mmadụ na-agwa ya kwa ụkwara mee ya ọdajụọ nke ga-eme ka ọnye ụkwara ahụ na-akwa hie ụra.

Nke a pụtara, n'okwu ya; "Ọgwụ ụkwara anaghị ala ụkwara n'onwe ya."

Dọkịnta Mustafa kọwara na ọgwụ bụ iji mee ka ahụ juo onye ụkwara na-akwa oyi ebe ndị dibia ga-enye ya ọgwụ na-achụ nje butere ụkwara ahụ.

Mana maka na ọgwụ ụkwara na-atọ ụtọ nke ukwuu ma nweekwa akụrụngwa na-emetụta ụbụrụ, onye na-enweghi ụkwara ṅụọ ya, ọd ị ya ụtọ n'ọnụ ma mee ụbụrụ ya adaa jụọ etu o si eme onye ụkwara na-akwa.

Nke a kpatara onye ṅụchaa ya, ọ chọwa ọzọ, mana ọ bụ ọtọ m egbu m.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a