Ụlọikpe ajụla na-agaghị ahapụ Dino Melaye rue Juunu 11

Dino Melaye Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo E ji ụgbọala ọrịa buga Melaye Kogi steeti

Sinetọ na-anọchi ndị Kogi west n'ụlọomeiwu sineti bụ sinetọ Dino Melaye eruola na steeti ya bụ Kogi maka na ndị uweojii chọrọ ikpọga ya n'ụlọikpe taa.

Ndị uweojii jiri ụgbọala e ji ebu ozu na ndị ọrịa we buga ya ebe ha kpọgara ya n'ụlọikpe nta na steeti ahụ.

E buru ụzọ buga ya n'ụlọọrụ ndị uweojii na-ahụ maka ndị ohi a na-akpọ SARS n'aha ịchafụ.

Ndị uweojii kwuru na ha na-ebo Melaye ebubo mmehie akparakpa ya na ndị mmadụ mere, imebi ngwongwo gọọmenti, ịnwa igbu onwe ya nakwa ịgbapụ n'ebe e jidere ya.

Ụlọikpe a a na-akpụpụ ya taa na-eso ka ndị ụlọọgwụ hapụrụ ya dịka e gosiri na o nwereike ịgali ụlọikpe.

Image copyright Facebook/Dino Melaye
Nkenke aha onyonyo Dino Melaye

Cheta na Melaye nwetara onwe ya n'ụlọọgwụ ịka ọ siri n'ụgbọala ndị uweojii bu ya wụpụ ụbọchị 24 Epurel n'ụzọ Kogi.

E kwukwara na okweghi ka ndị uweojii nwụchigharịa ya ọzọ dịka ụfọdụ ndị nọ ya nsọ dị njikere imeru ndị uweojii ahụ ma ha chọọ ịnwuchu ya.

N'aka nke ọzọ, onye omeiwu ahụ gbanahụrịrị nkata ịkpọghachi ya dịka ndị Inec mere nyocha maka ndị binyere aka ka a kpọghachite ya mana ndị bịara erughi pasentị iwu kwuru.

Nyocha ahụ nke e mere ụbọchị satọde abalị 28 ọnwa Epurel nyere Melaye mmeri ebe ndị binyere aka ahụ egosighi onwe ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị: