Ebubo mmerụaka: PDP na Gọọmentị na-arụrịta onwe ha aka

Buhari, Osibanjo Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Na nsonso a, osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo boro ebubo na gọọmenti chịburu kere N150 billion izuụka abụọ tupu ntuliaka 2015

Ụlọọrụ onyeisiala agọọla na ebubo mmerụaka nke otu PDP na-ebo ụlọọrụ gọọmenti etiti ma kwuo na ebubo ndị ahụ bụ iji kpasasịa ndị mmadụ anya.

N'ụbọchị ụka, otu PDP gwara osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo ka ọ gwa ndị Naijiria ihe ọ mara maka ebubo mmerụaka nke na-eme n'ụlọọrụ gọọmenti ndị ọ na-elekọta.

Onye nnyemaka osote onyeisiala n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Laolu Akande kwuru na, "Atụmatụ ọbụla iji mesasịa ndị mmadụ anya bụ mbọ lara n'iyi n'ihi na ndị Naijiria mara n'ezie onye ha kwenyere.

Ọ bụ ihe ihere etu PDP che na ha ga-aghọgbunwu ndị Naijiria."

Ọ kwukwara, "Ndị Naijiria agaghị ekwe ka a kpasasịa ebubo mmerụaka na mpụ mere n'oge ọchịchị gara aga".

Ọ kwuru na gọọmenti Buhari ewepụtala ozi doro anya maka mpụ na mmerụaka mere n'oge ọchịchị gara aga.

Anyị na-ahụkwa mbọ ịghafu okwu na-ekwu ihe onweghị ihe igbaka ebe."

N'akwụkwọ PDP wepụtara nke odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Kola Ologbondiyan tinyere aka ya, PDP rụrụ gọọmenti ugbua aka sị na ndị Naijirịa ọkachasị ndị na-eto eto na-enwe obi mgbawaa na osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo hapụrụ onwe ya ka ọ bụrụ ihe e ji emesasị ndị mmadụ anya na-edobeghị iwu na mmerụaka nke juru Gọọmentị etiti nke otu APC nọ n'isi ya.

Ha na-ekwu na ọ bụ ihe gbara gharị na Osibanjo na-arụ ndị pati ọzọ aka, ma gba nkịti n'okwu mmerụaka nke dị n'ọchịchị Buhari, nke gụnyere akwụkwọ gosiri mmefu taarị naira itoolu(N9 trillion) ego ọrụ ngo NNPC, mmefu ego amapụtara maka ndị gbara ọsọ ndụ(IDPs), ego maka inshọransị ahụike (NHIS)' nakwa ebubo na ha ritere uru ego ezutere ezute na ime ntuliaka gara aga.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a