Rochas ọ gara Daura ime gịnị ụnyaahụ?

Rochas na Buhari Image copyright Getty Images

Akụkọ na-ekwu na aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ji ọsọ gbagaa be onyeisiala Muhammadu Buhari na Daura dị na Katsin steeti ụbọchị ụka.

E kwuru na ọ gara ịrịọ ka Buhari kagbuo nhọpụta nke otu pati ha bụ APC mere n'Imo steeti ụbọchị Satode maka na ya bụ Rochas achịtaghị aja na ya bụ nhọpụta.

Rochas kwuru na ọgbakọ ndị APC na steeti ya nke a nọ na ya mee nhọpụta ahụ bụ ihe ọchị nke mere Buhari ga-eji kwụsị ya.

Ka ya na onyeisiala mechara ọgbakọ ahụ na Daura, Okorocha kwuru na ya tụrụ anya ndọrọndọrọ onye kwuo uche ya n'ime pati ahụ maka na ya bụ ụzọ kacha mma.

N'okwu ya; "Ụdị ndọrọndọrọ ndị a na-atọ ọchị kwesiri ịkwụsị ebe ndị mmadụ na-achọ ibu igbe e ji eme mbinyeaka ma gbanwee mpụtara mbinyeaka ahụ bụ ihe agba ochie.

"Agwara m onyeisiala etu o si gaa ma kwee nkwa ịkwụsị ya."

Okorocha kwuru na onyeisiala kwuru okwu dịka onyeisiala na ya ga-agba mbọ hụ na ihe ndị ahụ bịara n'isi njedebe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: