Codeine: Nafdac emechiela ụlọọrụ ọgwụ atọ na-arụ codeine

Codeine, ọtọmegbum
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị ntorobịa na-arịa isimgbaka na ọrịa dị icheiche n'ihi oke ịṅụ ọgwụ ụkwara

Ngalaba na-ahazi nlekọta nri na mmepụta ọgwụ bụ Nafdac n'aha ịchafụ emechiela ụlọrụ ọgwụ atọ; Bioraj Pharmaceutical Limited , Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd na Peace Standard Pharmaceutical Limited bụ ụlọọrụ a rụrụ aka n'ihe gbasara ire ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ megidere iwu.

BBC wepụtara akụkọ so nchọpụta nzuzo ha meere nke gbara n'anwụ ka ụlọọrụ atọ a si jiri ụzọ azụ ụlọ na-eresi ọgwụ a nke e mere n'iwu ka a na-ere naani oge dọkịta nyere akwụkwọ, nye ndị ntorobịa agharaaghara.

N'akwụkwọ ozi onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye wepụtara, mmechi a sotara nchọpụta ha mere dịka ha gachara n'ụlọọrụ ndị ahụ.

"N'ihi e nwetaghị ihe akaebe zuru oke na mbọ igbochi iwepụta akwụkwọ kwesịrị oge anyị mere nyocha anyị n'ụbọchị 2 nke ọnwa Mee, n'ụlọọrụ ha dị n'Ịlorin na Lagos, ọ dị mkpa ka e mechie ụlọọrụ mmepụta ahịa ụlọọrụ atọ ndị a - Peace Standard Pharmaceutical Limited ; Bioraj Pharmaceutical Limited na Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd . Nke a bụ iji nye ohere maka nchọpụta zuru oke."

Image copyright @DGatNAFDAC
Nkenke aha onyonyo Nafdac na-eme nyocha ndịa maka nchọpụta BBC mere gbasara ọgwụ ahụ

Adeyeye kwukwara na imepe ụlọọrụ ndị a ga-agbado ụkwụ ka ụlọọrụ ndị a si nye Nafac nkwado na nyocha ha.

O kwuru na otu Nafdac nke gụnyere ndị ọrụ itoolu; abụọ bụ ndị na-enyocha ọgwụ na asaa bụ ndị nchọpụta n-ahụ maka idewe iwu na ndị uweojii iri gara Ilorin n'ụbọchị ahụ, ị ga mee nyocha ụlọọrụ abụọ e nyere ikike ime ọgwụ ụkwara nwere codeine, ndị a kpọrọ aha n'akụkọ nyocha nke BBC wepụtara.

Dika Adeyeye siri kwuo, otu ndị ahụ bụkwa ndị e zigara n'ụlọọrụ Emzor na Lagos.

O kwuru: "Isi ozi e zigara ha bụ ị ga lele akwụkwọ oriri na nkesa ọgwụ ụkwara nwere codeine nye ndị na-aṅụ ya."

O kwuru na Nafdac akpọọla oku nzụkọ ndị ihe gbasara ọgwụ metụtara.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a