Ebola: DR Kongo ekwupụtala na ọrịa ahụ ebidola ọhụrụ a

Ndị ọrụ ahụike Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ebola bịara na Naịjirịa na 2014 mana gọọmenti Naịjirịa jidere ya nkeọma

E kwuola na Ebola abịala ọzọ na mpaghara ugwu mba DR Kongo.

A chọpụtala mmadụ abụọ bu ọrịa ahụ ebe mmadụ 17 nwụrụla, dịka ndị ọrụ ahụike na mba ahụ kwuru ụbọchị Tuzde.

Ihe mberede ọhụrụ a mere n' obodo Bikoro na-abịa dịka ọ karịrị otu afọ ọrịa ahụ gburu ọtụtụ ndị mmadụ na mba ahụ.

N'afọ 2014, ihe karịrị mmadụ 11,000 nwuru na mba Gini, Siera Lionu na Liberia.

Cheta n'afọ 2014, onye mba Liberia, Patrick sawyer bu Ebola batara Legos we kesaa ya.

Ndị nwụrụ na ya bụ bụ ọrịa na Naịjirịa bụ mmadụ asatọ, anọ n'ime ha bụ ndị aọrụahụike letara Sawyer, ebe ndị ọzọ a kpọpụrụ maka na a na-enyocha mechara gbakee.

A chọpụtara maka ọrịa ahụ ọzọ oge mpụtara nyocha e mere gosipụtara ọrịa ahụ na mmadụ abụọ n'ime mmadụ ise a na-enyo enyo bu ọrịa ahụ dịka ndị ọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health organisation( WHO) siri kwuo.

N'okwu onye ọrụ WHO bụ Peter Salama; "Ihe kachasị anyị mkpa bu inweta Bikoro ka ha soro gọọmenti ha rụkọọ ọrụ."

"Ndị mmadụ ịrụkọ ọrụ ma zaghachị ọrịa ahụ n'usoro ziri ezi ga-enye nnukwu aka ijide ọrịa ahụ otu ebe."

WHO kwuru na ha ewepụtala ego ruru otu nde dọla site n'ego gbatagbata ebe ha ziterela ihe ruru ndị ọrụ ahụike mmadụ 50 ka ha na ndị gọọmentị DR Kongo rụkọo ọrụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara

Nke a bụ ugbo itoolu a na-enwe Ebola na DR Kongo.

Ya bụ ọrịa bidoro mbụ n'afọ 1976 (oge a mara mba ahụ dịka Zaire). Aha ọrịa ahụ sitere n'otu mmiri dị n'obodo ahụ a na-akpọ Ebola.

A na-eche na ọ bụ ikwuikwui na-ata mkpụrụ osisi na-ekesa Ebola ahụ nke mmadụ na-ebute site n'iri anụ ọhịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a