Eurovision 2018: Mụ na onwe ga-na alụ rue ọnwụ- Netta

Netta Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Netta Barzilai ji egwu,"Abụghị m ngwaegwu gị" were merie na Eurovision nke afọ 2018

Netta, onye meriri na Eurovision 2018 ekwuola na ya na-onwe ya ga na asọ mpị ganye n'ọkwụ.

Netta bụ onye Israel ji eegwu ya a kpọrọ 'Toy' were merie Eleni, onye Cyprus n'asọmpị Eurovision bụ asọmpị egwu a na- eme n'ihe nke mba ndị nọ na otu mgbasaozi Yurope nke a kpọrọ, 'European Broadcasting Union' (EBU) na asụsụ bekee na-eme kemgbe afọ 1956.

N'izuụka tupu ngwụcha asọmpị ahụ, ọ bụ egwu Netta na -ewu mana ka o ruru abalị ole na ole gara aga ọ bụ Eleni Foureira na-ewu.

Netta gwara BBC na ya chọpụtara na ya"pụrụ iche" n'ihi ka ọ si dị abadaba ma hụkwa na"a naghị anabata onye pụrụ iche".

N'etiti ndị ntaakụkọ, e chere na onweghị ebe Netta ji azụ aga- dịka e chere na mba Cyprus, France, Ireland na Italy nwere ndị ka chapụ achapụ na nka.

Mana ka a gụkọrọ ihe onye nwetara n'ọkara oge, ndị isi ngụkọ hụrụ na netta nọ n'ọkwa nke atọ.

Mgbe a gbakọnyere vootu nke ọha mmadụ nyere, netta onye gbara afọ iri abụọ na ise nwetara akara karịchara na aka ndị nọ n'ụlọ ha ekiri asọmpị ahụ.

Ha huru onye na-akpa ọchị ma na ekwusa ozi mmadụ ịnabata ka ọsị hụ onwe ya.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Netta jiri vootu dị 529 merie

Netta ji vootu 529 merie, ebe Elei nwetara 436.

Netta kwuru na asọmpi ahụ abụghị maka ya na Eleni kama ọ bụ maka onwe ya.

O kwuru na mkparitaụka ya na BBC nwere ka o merichara sị,"Mụ na onwe ga na-asọ mpi rue ọnwụ".

E wezuga mmeri Netta, ihe ndị egwu na-amasị n'ekwu bụ maka mwakpo mere oge SuRie nke mba Briten gụrụ egwu ya.

A napụrụ Surie igwe e ji ekwu okwu dịka ọ na-agụ egwu nke mere na ọ gụghị ihe obula ntabianya iri na ise.

Ndị egwu na-amasị kwadoro ya ma jaa ya ike, ọ gụchara egwu ya mana ahụ mara ya jiji.

E nyere ya ohere ịghụgharị mana ọ jụrụ.

Akụkọ ọzọ ga-amasị gị: