Ihe ise ị maghị maka 'Yahoo-Yahoo'

Kọmputa Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị otiegwu na-akwalite mpụ 'Yahoo-Yahoo' site n'egwu ha na agụ

O ruela abali atọ "Yahoo" ji na-ewu na soshal midia na Naijiria.

Dịka ndị EFCC wakpochara ụlọ oriri ma nwụchie ndị a na-eche na ha bụ ndị ji Yahoo-Yahoo aracha mmanụ, ọ bụrula isi okwu ndọrịtaụka n'etiti ndị na-eto eto na Naijiria.

Ma lee ihe ise ị maghị maka ụzọ ụfọdụ ndị ọjọọ ji aracha mmanụ:

1.Kedu ebe aha 'Yahoo' ahụ si?

Ndị "Yahoo" maọbụ 'Yahoo-Yahoo' bụ aha a na-akpọ ndị ji aghụghọ anata ndị mmadụ ego maọbụ ihe dị oke ọnụ site n'igwe okwu intanet.

Ọtụtụ ndị okenye maara Yahoo dịka igwe okwu e ji ezirịta ozi nke ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Amerịka a kpọrọ, Stanford University bụ Jerry Yang na David Filo bidoro n'afọ 1995.

Mana na Naijiria, ndị ọgba ọhụrụ ji aha ahụ mara ndị ji intanet anapụta ndị mmadụ ọkachasị ndị mba ofesi ego n'ihi na mpụ a bidoro site n'iji Yahoo ezirịta ozi.

2. Ị makwa na ọ bụ mba Amerịka bụ isi na mba ndị ji aghụghọ anapụ ndị mmadụ ego ha?

Aha Naịjirịa na-ewu karịchaa mba ndị ọzọ n'ihe gbasara iji aghụghọ napụ mmadụ ego ya, mana ọ bụ mba Amerịka bụ ebe ndị omekome ji intanet akpa ike ka n'ọnụọgụgụ.

Dịka ngụkọ e mere n'afọ 2006 siri kwuo, pasentị iri isii na otu (61), ndị omekome intanet si Amerịka, pasentị 16 si Briten, ebe pasentị 6 si Naijiria.

Mba ndị ọzọ na-etinye aka n'ihe ọjọọ a gụnyere Saụt-Afrika, Togo, Aivrị Costu nakwa Nedaland.

3. O doro gị anya na akụkọ ngharamaụgha ha agbanwela?

Na mbido, ndị omekeome na-ezipụ ozi site na 'Yahoomail' na igwe okwu intanet ndị ọzọ na-akọwara onye ha chọrọ ịghọgbu na ha bụ onye ọrụ gọọmentị nwere nnukwu ego ha chọrọ izupu ala bekee nke ha chọrọ enyemaka onye mba ofesi ma rịọ ka onye ahụ kwụta obere ego iji mee ka ọ gaa siriri werere.

Ma ugbua, ọtụtụ ha na-esi n'igwe okwu ọgbakọ ebe ha na-egosi ọnwe ha dịka nwoke onye ala bekee chọrọ nwaanyị maọbụ nwaanyị chọrọ nwoke ya na ya ga-adị na mma.

Dịka otu na-anata mkpesa maka iji aghụghọ napụ mmadụ ihe ya nke a kpọrọ, 'Internet Crime Complaint Center' siri kwuo, iji okwu ịhụnaanya were ghọgbuo mmadụ bụ mkpesa kachasị n'afọ 2014 dịka e nwere nsogbu metụtara nke a dị 5,883.

4. Ị mara ihe mere e ji akpọ 'Yahoo-Yahoo' 419?

Ọtụtụ mmadụ na Naijiria mara na ihe a na-akpọkarị 'Yahoo-Yahoo'n'ala Naijiria bụ '419', mana ọtụtụ amaghị ebe akara ahụ si.

"419" bụ ngụkọ njirimara akụkọ n'iwu Naijiria megidere mpụ iji aghụghọ nara mmadụ ego ya na ntaramahụhụ dịrị onye daara iwu ahụ.

5. Ị makwa na ndị otiegwu soro buru nsogbu Yahoo?

Nsogbu a ebidoghị taa. Ọ rịrị elu n'oge ọchịchị Ibrahim Badamosi Babangida nke mere gọọmenti ji iwu pụrụ iche iji mabido mpụ a.

Mana dịka ndị Igbo na-atụ n'ilu sị, 'arụ gbaa afọ ọ bụrụ omenaala', ndị otiegwu ụfọdụ jizi egwu ha na-eto mpụ napụrụ nwata ara nne ya n'ọnụ.

Egwu dịka, 'Maga don pay' nke Kelly Hansome gụrụ, 'I go chop your dollar' Nkem Owoh, 'Yahoozee' nke Olu Maintain gụrụ bụcha egwu na-eto iji aghụghọ napụta ego.

Ka ụfọdụ ndị egwu na-eto ime 'yahoo-Yahoo', ndị ogbo ha na-eto ndị na-eme ya.

I gee egwu ụfọdụ ndị otiegwu ị maara na-etu aha n'egwu ha, ọtụtụ bụ ndị ebe ha siri kpata ego ha edoghị anya.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a