Sineti: Anyị agaghị akwụsị Omo-Agege ịbia ọgbakọ

Sinetọ Ovie Omo-Agege Image copyright Sen Ovie/ Twitter
Nkenke aha onyonyo Ndị sinetị kwụsịrị ya ọrụ ụbọchị iri itoolu

Ndị ụlọomeiwu Sineti ekwuola na ha agaghị igbochi Sinetọ Ovie Omo-Agege ibido ọrụ ọzọ.

Onyeisioche kọmitii mgbasaozi ha dị n'aka bụ Sabi Aliyu Abdullahi kwuru na onye ọkaiwu ha agwala ha maka mkpebi ahụ nke ụlọikpe nyere na Tọọsde gara aga banyere okwu ahụ.

N'okwu ya, Abdullahi sị," Anyị agbala akwụkwọ ikpe mkpegharị n'ụlọikpe."

Ọ gara n'ihu kwuo,"Dika ndị na-edowe iwu obodo na mkpebi ụlọikpe, ulọomeiwu ekpebiela ige ntị na mkpebi nke ụlọikpe ukwu nke etiti mere.

Anyị aghaghị eme ihe ọ bụla iji kwụsị Sinetọ Ovie Omo-Agege ibido ọrụ n'ụlọrụ ya nakwa isonye na ọgbakọ anyị site na ụbọchị ịrị na ise nke ọnwa Mee( May 15) afọ 2018, ganye na e nwe mkpebi na akwụkwọ anyị mgbagharịrị."

Ndị ụlọomeiwu ukwu kwụsịrị Omo-Agege ọrụ n'ike n'ihi na ọ na-akwụnyere Buhari na nhazigharị atụmatụ etu ntuliaka 2019 ga-esi ga mana ọ gbara ha akwụkwọ n'ụlọikpe ma merie.

Ndị Sinetọ kwuburu na ha agaghị ekwe ka o bido oru mana ha mechara kwugharịa.

Nhazi atụmatụ ntuliaka 2019 nke ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec n'aha ịchafụ wepụtara buwere ntuliaka ọkwa onyeisiala ụzọ mana ụlọomeiwu ukwu tụgharịrị ya.

Onyeisiala Muhammadu Buhari jụkwara itinye aka na iwu ahụ oge Sineti mechara nke a.

Image copyright @NGRSenate

Ụlọikpe nke kpere ikpe Ọmo-Agege na ndị Sineti nke Jọstis Nnamdi Dimgba nọ n'isei ya kwuru na ịkwụsị Omo-Agege ọrụ n'ike megidere iwu, na ihe ha kwuru ha jiri chụla ya megidekwara iwu.

"Dịka ndị ụlọomeiwu nwere ikike nye onye otu ha ntaramahụhụ, ihe ha kwueuru ha jiri nye ya ntaramahụhụ megiderer iwu.

"Ya mere, a na m akagbu nkwụsịọrụnike nke onye a gbara akwụkwọ n'ụlọikpe nke gbadoro ụkwụ na kọmiti na ahụ maka omume kwesiri ekwesi na mkpesa ọha ozigbo ozigbo."

Okaikpe ahụ nyekwaara iwu ka ụlọomeiwu kwụọ Omo-Agege ụgwọ ruru ya oge ọ nọ na nkwụsịọrụnike ahụ."

O kwuru na inye nkwusịọrụnike ọnwa atọ megidere iwu Sineti nke kwuru na a ga akwụsị onye omeiwu naanị abali iri na anọ(14 legislative days.)

Akụkọ ndị ga-amasị gị: