Ụlọomeiwu ejirila N500bn bulite bọjeti

Ụlọomeiwu Sineti Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhariwepụtara ndị ụlọoimiwu Bojet afọ 2018 ọnwa isi gara aga.

N'ụbọchị Tuusde, Ụlọomeiwu ukwu na nke nta wepụtara Bọjeti nke afọ 2018, ebe ha bulirị ego gọọmenti ga-emefu n'afọ site na tarịị naira 8.612 ga tarịị naira 9.120, nke pụtara mmanyekwu ijeri naira 500.

Mgbari ego ahụ nke pụtara N9,120,334,988,225, gọsiri na e hiwere N530,421,368,624 maka nkesa dị na iwu ( Statutory Transfers).

E hiwere N2,203,835,365,699 maka ịkwụ ụgwọ eji eji(Debt Service nke ọnụego N190,000,000,000 bụ maka ụgwọ ruola ọkwụkwụ.

E hiwerekwara N3,516,477,902,077 maka ego mmefu ego a na-eme kwa mgbe kwa mgbe (Recurrent Expenditure.)

Ha hiwekwara N2,869,600,351,825 dịka ego maka imepụta mwulite doro anya( Development Fund for Capital Expenditures) n'afọ ga-akwụ ma ọnwa Disemba gba iri ato na otu.

Cheta na gọọmenti etiti wegara ndị ụlọoimewu Bojeti afọ 2018 ọnwa isi gara aga.

N'ụlọomeiwu nke ukwu onye bupụtara akwụkwọ Bọjet bụ onyeisioche kọmitii lebanyere ya anya bụ Sinetọ Danjuma Goje.

N'otu aka ahụ, Mustapha Bala Madaki bụ onye bupụtara akwụkwọ ahụ na'ụlọomeiwu nke nta.

Ọnụ na-ekwuchitere Sineti bụ Aliyu Sabi Abdullahi kwuru n'izuụka gara aga na aga-ebuta ya na Tuusde ma tulee ya na Wenezde, ebe ha ga etinye aka n'akwụkwọ ahụ na Tọọsde.

Osote onyeisi Ụlọomeiwu nta bụ Yussuff Lasun, kwuru na ha ga-atulee Bojeti na Tuusde ma tinye aka na ya n'Wenezde mana ọ bụrụ na ha emepụghị ya, ha ga-emezu itiinye aka n'akwụkwọ ahụ na Tọọsde.

Akụkọ ga-amasị gị: