Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Ọrụ agaghị akwụsị n'akwa Niger nke abụọ - Fashola
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:

Ebe foto si, Getty Images
Fashola kwuru na ọrụ kwụsịburu n'akwa Niger nke abụọ oge ọ batara ọrụ, mana ha ga-agba mbọ rụchaa ya
Minista na-ahụ maka ọrụ na ọkụ bụ Babatunde Fashola, ekwuola na ebidola ọrụ n'elu akwa Niger nke abụọ, ma kwukwaa na ọ hụghị ihe ga-eme ka a kwụsị ọrụ ebe ahụ ọzọ maka na gọọmentị amapụtala ego e ji arụcha ya.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Ebe foto si, @HQNigerianArmy
Boko Haram na-eji zi ụmụnwaanyị kwara ngwagha ogbunigwe mgbagbuonwe
Ndị agha nchekwa Naịjirịa akpọrọ Operation Lafiya Dole kwuru na-anwụchiri otu nwaanyị yi uwe ogbunigwe baa n'ụlọ ndị alakụba dị na Gashua, Yobe Steeti n'isi ụtụtụ taa.
Anwụchiri nwaanyị a dịka ọ na-achọ ịgbapụ ogbunigwe ahụ mgbe ndị a na-achọ ikpe ekpere ụtụtụ.
Etu a ka ndị mmadụ gaara esi nwụọ maka ikperechi Ha.
Na mba ofesi,
Ebe foto si, Reuters
Ụgbọelu a kpọkasịrị mgbe ọ dara
Achọpụtala na ụlọọrụ Damojh nwe ụgbọelu ahụ kpọkasịrị ma gbuo mmadụ otu narị na iri na mba Cuba nwetara mkpesa maka ọnọdụ ụgbọelu ha n'oge gara aga.
Mkpesa ndị a gụnyere ibufe oke ibu, ingin ịkwụsị ọrụ nakwa nkwụsị igwe na-enye ya ọkụ.
N'egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Roman Abramovich gotere Chelsea n'afọ 2003
Dịka otu Chelsea buliri iko FA, ị ma na onye nwe ha abịanwughị lelee ka ha si merie?
Akụkọ kwuru na Roman Abramovic abatanwughị England maka na o megharịnwughị akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ nke a kpọrọ Visa n'oge.
Gee nkeji anyị na mgbede a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri taa
N'ime izu agara aga, ndị otu abuo pụtara n'APC Imo Steeti gara kpesara ndị isi ha n'Abuja ihe na-esere ha. N'ihe onyonyo a, TOE Ekechi bụ otu n'ime ndị na-asị Gọvanọ Okorocha kwapụkwapụ kọwaara BBC ebe ya bụ mmiri siri banye opi ụgbọgụrụ.
Ọgbaghara otu APC Imo steeti eruola Abuja