Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Mikel Obi na Kelechi Iheanacho kwuru na ha mara Ingland nke ọma

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Nnukwu ụgbọala akwọriela nwaanyị ku nwa na mmadụ isii ndị ọzọ n'Owerri

Motor acident.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọ bụghị ụgbọala ka mgberede a mere

Otu nwaanyị ku nwa n'aka na mmadụ isii ndị ọzọ etufuola ndụ ha n'ihe mberede okporoụzọ mere n'Owerri.

Ndị ọrụ nchekwa FRSC kwuru na nchọpụta ha na-atụ onye kwọ nnukwu ụgbọala kụrụ ụgbọala mmadụ iri na isii si Ọnịcha nọ n'ime ya.

Naịjirịa

Ndị ọchịehi a ga-abụ otu na-eyi ọha egwu ka ha agahị abụ?

onye ọchịehị na ehi ya.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue na steeti ndị ọzọ dị na Naịjirịa

Ụlọikpe etiti nọ n'Abuja ga-amalite ụbọchị iri na abụọ ọnwa Juunu ileba anya ka a ga-akpọ ndị ọchịehi otu na-eyi ọha egwu.

Ọ ga-elebakwa anya n'akwụkwọ e degara ya ka ha kwụsị ndị ọchịehi ịchụ ehi na Benue steeti maka mkpamkpa ha na-akpa eba ahụ.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Ọgbaghara mere n'APC Ekiti steeti chọrọ ịta isi Fayemi.

Otu APC ekwuola na ọgbaghara mere n'Ekiti bụ onye bụbu gọvanọ steeti ahụ bụ Kayode Fayemi ka a chọrọ igbu.

Fayemi hapụrụ ọkwa ya dịka mịnịsịta na-ahụ maka ngwụputa ịga zọọ gaọvanọ ọzọ n'Ekiti.

Akụkọ mba ofesi

Kenya chọrọ ịhụ na ndị ọrụ ha niile bụ ndị na-ekwu eziokwu.

Uhuru Kenyatta

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Uhuru Kenyatta kwere nkwa ịchụ mpụ oge o meriri ntuliaka n'afọ 2013

Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta ekwuola na ndị na-achọ ọkwa ọchịchị na gọọmenti ya ga-agafe mashine na-enyocha asị.

Kenyatta kwuru na nke a bụ iji nyochaa ndị ọrụ ha maa chụkwa mpụ ọsọ.

N'egwuregwu,

Naịjirịa na Ingland ga-akwata ya na ọgbọ Wembley taa.

Dịka Naịjirịa na Igland ga-agba asọmpi enyi na enyi taa, Mikel Obi na Kelechi Iheanacho kwuru ka a wụsara ha ọwara maka ya bụ asọmpi.

Ha kwuru na nke a bụ maka na ha mara mba Ingland nkeọma ebe Mikel gbaburu Chelsea ma Iheanacho na-agbara Leicestere City bọọlụ.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo,

Lee etu ndị APC ji kataka were gbasaa ntuli aka ha n’Enugwu