Akụkọ kachasị n'abalị a: Ụlọ omeiwu abụọ agbakụtala Ibrahim idris azụ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:

Ndị omeiwu na onyeisi ndị uweojii na-akwata ya.

Image copyright Getty Images

Ndị omeiwu ukwu na nke nta ekwuola na ha enweghi ntụkwasị obi ebe onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris nọ.

Nke a sotere nzụkọ mberede pụrụiche nke ụlọomeiwu abụọ ahụ mere n'ime ụlọ.

Naịjirịa

Buhari na ndị ọchịagha mere ọgbakọ taa

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị ọchị agha niile na Naịjirịa nwere ọgbakọ taa ebe ha kpara etu nchekwa ala Naịjirịa dị ugbua.

Nke a na-esote ọgbakọ onyeisiala na osote ya bụ Yemi Osibanjo mere ụnyaahụ n'etiti ndị ọchị agha ahụ n'oge dị iche iche .

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Naịjirịa dị nkwadebe ịnabata ndị ọbịa.

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Buhari ekwola na Naịjirịa nwere nchekwa ịnabata ndị ọbịa na-abịa ilegharị anya nke a kpọrọ tourism na Bekee.

Buhari kwuru nke a oge onyeisi na-ahụ maka njegharị n'otu mbaụwa United Nations bú Zurab Pololikashvili gara leta ya.

Akụkọ mba ofesi

Agụiyi dọgburu mmadụ na Etiopia

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Agụiyi na-ebi na ezu ụfọdụ

Agụiyi adọgbuola ụkọchukwu na-eme ndị ụka ya mmirichukwu n'akụkụ ezu na mba Etiopịa.

Akụkọ sị n'aka ndị uweojii na ndị bi na mpaghara ahụ kwuru na agụiyi dọgburu Pastọ Docho Eshete ka ọ na-eme ndị otu ya mmirichukwu na mmiri ahụ.

Agụiyi adọgbuola ụkọchukwu

N'egwuregwu,

Otu egwu bọọlụ Man U na-anabata Shakhtar

Image copyright AFP

Otu egwu bọọlụ Manchester United etinyela aka n'akwụkwọ ịzụ onye egwurewu bọọlụ mba Brazil bụ Fred nde pound iri ise na abụọ.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMkparita uka BBC Igbo Omwiewu Ukwu Mao Ohuabunwa