Akụkọ kachasị n'abalị a: Donald Trump na Kim Jong-un eruola Sịngapọ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:

Otu na-ahụ maka ihe gbata gbata bụ Red Cross ekwuola na eburula mmadụ ruru iri atọ n'itoolu gaa ụlọọgwụ mgbe ọdọ mmiri tiwara n'isiobodo Kenya bụ Nairobi.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị uweojii n'Enugwu ji ike na ebube achụ ndị otu ọjọọ ọsọ n'Enugwu

Ọdọ mmiri ahụ tiwara site n'oke mmiri ozuzo gburu mmadụ otu narị n'iri abụọ 120.

Naịjirịa

Oko osisi adaala na Naịjirịa taa

Ebe foto si, Ras Kimono/ Facebook

Akụkọ na-eme ugbua na soshal midia na-ekwu na onye oti egwu rege a ma ama bụ Ras Kimono anwụọla na Legos taa.

Akụkọ kwuru na e bugara Ras n'ụlọọgwụ ụnyaahụ dịka ọ tụbọrọ daa mana o mechara nwụọ n'ụlọọgwụ ahụ dị n'Ikoyi taa.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Buhari ahapụla Naịjirịa gawa Moroko

Ebe foto si, NGR President/ Twitter

Onyeisiala Muhammadu Buhari ahapụla Naịjirịa gawa Moroko ebe onyeisiala ha bụ Eze Mohammed nke isii kpọrọ ya ka ọ bịa.

Ha ga-akpa maka ọdị mma mba abụọ ahụ.

Akụkọ mba ofesi

Amerịka na Nọt Koriya awuchiela na Sịngapọ maka ọgbakọ ha.

Ebe foto si, AFP

Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump na nke Nọt Koriya bụ Kim Jong-un erutela mba Sịngapọ maka ọgbakọ ha abụọ ga-eme ebe ahụ.

Ụwa niile na-ele ha anya ma na-eche ka a mara ka ha aga ekpeli udo n'ọụbakọ ahụ.

N'egwuregwu,

Super Eagles adịla njikere maka Rọshịa

Ndị Super Eagles ga-ahapụ ebe ha na-eme nkwado n'Ọstrịa gawa Rọshịa echi niile maka asọmpi Iko Mbaụwa

Cheta na Iko Mbaụwa a bụ nke isii Naịjiịra na-aga dịka ha pụtara ndị mbụ n'otu ha nọ na ya wee gbaa asọmpi iji torue ịga Rọshịa

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo,

Ịmaara ka Nkwụ si agba mmanya?