International Albinism Awareness Day: Lee nke bụ eziokwu na nghọtaghie ị nwere maka anyarị

Ndị anyarị

N'ụwa niile nke mpaghara Afrịka nakwa Naịjirịa so ya, ndị anyarị na-agabiga ịkpa oke site n'aka ndị dị icheiche maka agwa ahụ ha.

Ịkpa oke a bụ maka na ndị mmadụ chere na ha anaghị acha etu ndị ọzọ si acha, ya bụ ndị dị ọcha maọbụ ndị dị ojii.

Ndị anyarị bụ ndị nwere nsogbu dị n'agbụrụ bekee kpọrọ 'congenital disorder' nke na-eme ka ha ghara inwe agwa na-eme ka mmadụ dị ojii maọbụ dị ọcha nke a kpọrọ 'melanin' na bekee.

Dịka Dọkịta Chuka Agunwa nke ụlọọgwụ UNTH, Enugwu, siri kwuo, "Naanị ihe dị iche na anyarị na onye abụghị anyarị bụ na ihe na-eme akpụkpọ ahụ mmadụ adị ojii nke a kpọrọ 'melanin' ha enweghị ya."

Mana agwa ahụ emeghi ka ha kwụsị ịbụ mmadụ nke kpatara ndị mmadụ ji akọ ha ọnụ ma na-eme ha akaja maka ahụ ha.

N'ụfọdụ ebe n'Afrịka, a na-eji ha agwọ ọgwụ ma ọ bụ na-egbuchu ha egbuchu maka na a na-eche na ha na-eweta ego maọbụ na ha bụ abụmọnụ.

Otu onye anyarị bụ onye ntaakụkọ aha ya bụ Jude Nwabokei gwara BBC Igbo na dịka nwoke, ụfọdụ ụmụnwaanyị ekweghi ka ya na ha nwee mmekọ ọbụla maka etu o si acha.

N'okwu ya; "Eziokwu, ndị m na-arụrụ ọrụ enyela m ohere dịka ha nyere ndị ọzọ ime ihe ọbụla m kwesiri ime mana ọ bụ naanị oge m chọrọ ịlụ nwaanyị ka m nwetara ịkpa oke.

Ụmụnwaanyị abụọ m chụrụ achọghị iso m maka na m bụ anyarị."

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị anyarị bụkwa mmadụ nwere mmetụta, ọ dị mkpa ịkpaso ha ezi agwa

Nghọtaghie na nke bụ eziokwu banyere anyarị

E nwere ọtụtụ nghọtaghie gbasara ndị anyarị:

1. Ndị anyarị anaghị eri nnu

Dịka Dọkịta Chuka Agunwa nke ụlọọgwụ UNTH, Enugwu, siri kwuo, nke a abụghị eziokwu, o nweghị ihe ha na-asọ.

"Ọ bụghị eziokwu. O nweghị ihe dị iche na anyarị na onye abụghị anyarị. Ahụ ha zuru oke. Ọ bụghị ọrịa."

2. Ha anaghị ahụ ụzọ n'ehihie

Ọ bụchaghị eziokwu. Isi ekpughị ha, kama ndị anyarị anaghị ahụcha ụzọ ọfụma ka ndị ọzọ ma anwụ na-eke.

Dọkịta Agụnwa onye bụ ọkachamara n'ihe gbasara ahụike ọha, sị: "O nwere 'pigment' mmadụ na-enwe n'anya dịkwa ka nke a na-enwe n'akpụkpọ ahụ nke bụ 'melanin' nke ndị anyarị enweghị n'uju.

Nke a mere na ha anaghị ahụ ụzọ ọfụma ọkachasị ma anwụ na-acha."

3. Ndị anyarị ezughị oke dịka nwoke maọbụ nwaanyị

Dọkịta Agunwa kwuru na "o nweghị ka onye anyarị siri dị iche na ndị ọzọ dịka n'ịmụta nwa maọbụ ime ihe ndị ọzọ".

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a