Akụkọ kachasị n'abali a: Aka akparala onye na-amịpụ ọbara n'ụzọ megidere iwu

Akụkọ kachasị mere taa;

Rochas a tụrụ asị?

Nkọwa foto,

Okorocha na APC ka na-amaaka

Onye ode akwụkwọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) bụ Bolaji Abdullahi, ekwuola na ebubo dị iche iche gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha boro ndị isi otu ahụ gbasara ntuliaka ndị APC mere n'Imo steeti bụ asị asị.

N'ime akwụkwọ ozi Abdullahi dere ma zipuru ndị ntaakụkọ, o kwuru na otu APC na-adọ Okorocha aka na ntị, si ya kwụsị mkparị a ọ na-akparị onyeisi otu a bụ John Odigie-Oyegun.

Anwụchiela onye na-ere ọbara

Otu nwoke aha ya bụ Paul Achegbulu ekwupútala na ọ bụ eziokwu na ọ na-anapụta ndị mmadụ ọbara n'ụzọ megidere iwu ma na eregharí ya 'ihe ruru afọ ise.

O kwuru nke a ka ndị uweojii nwụchiri ya ka nwata dị afọ iri na asaa ọ mịịrị ọbara ma kwụọ puku naịra abụọ hụrụ onwe ya n'ụlọọgwụ.

E nwere ndị ka ndị ohi a dị iberibe?

Nkọwa foto,

Ndị uweojii ka na-ekpe ikpe ndị zuru ego n'offa n'ala Naịjirịa

Ndị uweojii anwụchiela ndị gara zuo ohi n'ụlọakụ Abyssinia dị na mba Ethiopia.

A nwụchiri ha maka na na-ahụghị ụzọ gbafuo oge ha nyabara ụgbọala ha n'okporoụzọ na-ekwo ekwo.

N'egwuruegwu,

Nkọwa foto,

Hierro gbabuuru Spen bọọlụ oge ọ bụ okorobịa

Ndị mba Spen chụrụ onye nchịkọta otu bọọlụ ha bụ Julen Lopetegui ka ọ natachara akwụkwọ ịrụ ọrụ dịka onye nchịkọta Real Madrid.

Ha nyere Fernando Hierro ọrụ ịkpọ Spen gaa Iko Mbaụwa nke a na-eme na Rọshịa.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Lee ihe nkiri taa

Aha onyonyo,

Oparanozie: Anyị na-ekpere Super Eagles ekpere