Lee ihe iri agbọghọ agba ọhụrụ chọrọ na nwoke ga-alụ ya

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ụmụada Igbo chọrọ na nwoke

Nwaanyị ọbụla toruru agbọghọ nwere ebumnobi ya dịka ụdị ihe ọ chọrọ na nwoke ga-alụ ya.

BBC Igbo gbara ụmụagbọghọ dị bidọ afọ iri na asatọ(18) rue iri abụọ na ise (25) ajụjụ banyere ihe ha chọrọ na nwoke ga-alụ ha.

Lee ọkpụrụkpụ ihe ndị pụtara ihe n'ime okwu ọtụtụ n'ime ha kwuru:

1. Ha chọrọ nwoke nwere ego

Image copyright Segun Oyeyemi
Nkenke aha onyonyo Ụmụagbọghọ agba ọhụrụ chọrọ nwoke nwere ego

Agbọghọbịa agba ọhụrụ achọghị ahụhụ ọbụla na be di ya.

Dịka Chinaza Ilochi siri kọwaa, "A chọrọ m onye ji ego, onye ga na-eleta m anya na-eletakwa ụmụ anyị anya. Ọ bụghị na m agaghị akpata ego nke m mana agaghị m elekwasa anya n'ego nke m."

Agbọghọ ọzọ achọghị ka a kpọọ aha ya sị: "A chọrọ ka di m nwee ego. A chọrọ m 'Assurance', ka o were leta ụmụ anyị anya. O nwere ụdị ọṅụ na-eso ma nwaanyị lụta di nweere ego."

2. Nwoke gụrụ akwụkwọ

Image copyright AFP

Ọ bụrụ na i chere n'ego bụ ebe e jedebere n'ihe niile dị mkpa iji nweta obi agbọghọ agba ọhụrụ, ị mara na ị nọ na mmiri, ncha a na-aba gị anya.

Ụmụagbọghọ ugbụa chọrọ nwoke gara akwụkwọ ọ ga-abụ ihe ịgụ akwụkwọ mee, ha ahụ onye ha ga agbakwuru.

Ifeanyichukwu Asogwa kwụrụ, "Achọrọ m nwoke gụrụ akwụkwọ. Onye ga-abụ onye nlereanya nye ụmụ anyị ga-amụ."

3.Nwoke nwere ịhụnanya

Image copyright Getty Images

Ọ bụghị agboghọ niile bubere nwoke inwe ego ụzọ.

O nwere ndị ihe kachasị ha mkpa bụ nwoke hụrụ ha n'anya.

" Achọrọ m nwoke hụrụ m n'anya ma were m ka m dị," bụ etu otu agbọghọ sịrị na ọ chọghị nwoke chọrọ ka ya gbanwe siri kọwa ya.

4. Nwoke nwere ezi agwa

Image copyright David Turnley

Ụmụagbọghọ agba ọhụrụ chọrọ nwoke nwere ezi omume.

Ogechukwu Agu bụ nwata akwụkwọ nọ n'otu mahadum dị n'ọwụwa-anyanwụ, Naijiria sị: "Onye na-anaghị ezuzu ezuzu, na-akwanyere onwe ya ugwu. Onye anaghị aṅụ oke mmanya."

5. Nwoke na-akwanyere nwaanyị ugwu

N'okwu otu nwata nwaanyị achọghị ka a kpọ aha ya, nwoke na-akwanyere nwaanyị ugwu.

"A chọrọ nwoke anyị ga-akparịta ụka etu anyị ga- esi ahazị ezinaụlọ anyị.

"Ụfọdụ ụmụnwoke anaghị achọ ige echiche nwunye ha."

6. Nwoke na-agba mbọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụagboghọ ugbua chọrọ nwoke dị ọgọ n'anya.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị achọghị nwoke dị umengwụ, ori ka dimkpa, ọrụ ka ngwụrọ.

"Ọ bụrụgodi na ọ na-arụ ọrụ, na-enweta ego, agbọghọ ugbua achọghị nwoke ọ ga na-enye nri, nwoke nọ na 'weta-ka-e-rie.'

Ọ bụghị etu a mkparị nwere ike iso ya.

7. Nwoke dị mma ile anya

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo ụmụagboghọ ugbua chọrọ nwoke dị ọgọ n'anya.

Ọ bụghị naanị nwoke chọrọ onye mara mma, ụmụagboghọ ugbua chọrọ nwoke dị ọgọ n'anya.

N'ụwa ugbua, naanị onye jọrọ njọ bụ onye anaghị eleta onwe ya anya.

Otu agboghọ sịrị : "Achọghị m ịlụ onye mkpụmkpụ. A chọrọ m onye chatụrụ ọcha. A chọghị m onye dị ojii."

8. Nwoke na-atụ egwu Chineke

Ụfọdụ ụmụnwaanyị chọrọ nwoke na-atụ Chukwu egwu.

Favour Nwachukwu sịrị: "A chọrọ m nwoke ga na-atụ Chineke ụjọ."

9. Nwoke anya ya dị n'ụlọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Agbọghọ ugbua nụ kepukepu na o nwere ihe jịkọrọ nwoke ya na nwaanyị ọzọ, ọkpọ a bụrụ n'anya

Agbanyeghị na nwoke mara mma, na-agba mbọ, ma nwee ego, o nweghị nwaanyị chọrọ nwoke na-agba n'iro.

N'oge gboo, nwoke nwere ohere iso nwaanyị ole masiri ya, ebe nwaanyị ya agaghị enwe ọnụ okwu ma ọ bụ mgbaka ahụ ọbụla maka ya.

Mana agbọghọ ugbua agaghị eji anya ya hụ maọbụ jiri ntị ya nụ na di ya na-agba n'iro.

Ọ nụ kepukepu na o nwere ihe jịkọrọ nwoke ya na nwaanyị ọzọ, ọkpọ a bụrụ n'anya.

10: Nwoke na-eme ọgọ

Ụmụnwaanyị achọghị nwoke anaghị eri eri, onye dị akpịkpị.

Ọ na-esiri nwoke bụ erieri ike inweta obi nwaanyị.

Chinaza kwuru, "A chọrọ m nwoke na-adịghị aka chịchịchị."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara