Akụkọ kachasị n'abali a: Trump na China na-ama aka n'ihe gbasara azụmahịa

Akụkọ kachasị mere taa;

E mewaala ndị Ijipt obi

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mohamed Salah gbajiri aka ka otu egwuregwu Liverpool na Real Madrid zutere n'asọmpi ngwụcha Champions League tupu Iko Mbaụwa ebido

Ndị Ijipti ebeela akwa arịrị ka ndị mba Yuregụaị meriri ha n'asọmpi abụọ nke Iko Mbaụwa a gbara taa.

Onye egwu bụ Jose Gimenez nyere goolu na nkeji iri itoolu, mewara ndị Ijpti obi ma mee ka ọtụtụ buru aka n'isi.

Ọkaiwu Evans eserela aka

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chukwudumeme Onwuamadike ama dịka Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa

Akụkọ anyị na-anụ ugbua bụ na Olukoya Ogungbeje bụ onye ọkaiwú Chukwudumeme Onwuamadike nke a ama dịka 'Evans' bụ onye a na-enyocha maka ịtọ mmadụ, esila n'ihe gbasara okwu ya sepụ aka.

N'ime akwụkwọ Ogungbeje depụtara, o kwuru na ọ bụ maka ebumnuche ihe gbasara ya ka o ji mee nke a.

Trump na China a na-ese okwu?

Image copyright Getty Images

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga-atụkwasị ego ụtụ ruru pasentị iri abụọ na ise n'elu ngwaahịa ndị si China.

O kwuru nke a ka ọ na-ebo ndị Beijing ebubo maka izu ihe mmepụta ọnatarachi nke bekee 'intellectual copyright theft'.

Ndị Naịjịrịa chọrọ ịnwụ ọkụkọ gaa Rọshịa

Image copyright Getty Images

Mba Rọshịa machiri ndị nkwado otu Super Eagles chọrọ iji ọkụkọ gaa n'ama egwuregwu maka asọmpi Naijiria nwere na ngwụcha izu a.

Cheta n'asọmpi iko mbaụwa nke afọ 2010 nke mere na Saụt Afrika, a machiri ndị nkwado Super Eagles iji ọkụkọ e tere uhie njirimara Naijiria n'ahụ banye amaegwuregwu Ellis Park dị na Johanesbọg maka asọmpi ha na Agentina.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Lee ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdi Igbo zara azịza maka ntuliaka 2019

Isiokwu Ndị Emetụtara