Akụkọ kachasị n'abalị a: Ozi ọma! Carl Ikeme agbakewela n'ọrịa
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a
Ogbunigwe agbaala na mba Afrịka abụọ
Ebe foto si, Getty Images
Ebe ogbunigwe a gbara mgbe ọ mechara n'Itiopịa
N'Itiopịa, ogbunigwe emerụọla ihe karịrị mmadụ iri asatọ na atọ ahụ ma gbuo otu onye.
Ogbunigwe a gbara n'ebe ndị na-akwado praịm mịnista ha bụ Abiy Ahmed gbakọrọ maka nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'akụkọ yiri ya, onweghị ihe mere Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa, ka ogbunigwe gbapụrụ n'obodo Bulawayo ka o kwuchara okwu ebe a na-eme nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị, mana, osote ya na ndị ọzọ ọkwa ha gbalitere, so na ndị merụrụ ahụ.
APC ahọpụtala onyeisi ọhụrụ
Ebe foto si, Nigeria Presidency
Ndị APC ebidola ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị ebe ha na-eme ntuliaka iji họpụta ndị ga-achị ha n'ime afọ anọ na-abịa.
Adams Oshiomhole bụbu aka na-achị Edo steeti pụtara ka onyeisioche APC na-enweghị onye na-azọsa ya oche.
N'egwuregwu,
Tunishịa alaala ka ndị Beljịọm nyụrụ ha ịkpakwụ ka ha gbara ha ọkpụ goolu ise a satara abụọ oge ha zutere n'Iko Mbaụwa taa.
Ebe Carl Ikeme bụ onye oche goolu Naịjirịa na-arịa ọrịa ọbara kemgbe otu afọ, kwuru na ọ gbakewela ma kelee ndị Naịjirịa na ndị otu Wolverhampton maka nkwado ha nyere ya.
Gee nkeji nke abalị a ebe a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa
Otu nwoke na-esi ofe gosiri akaọrụ ya ebe a.
Ofe onugbu