Akụkọ kachasị n'abalị a: Ụlọikpe enyela ndị otu Nnamdi Kanu 'bail'

Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a

Ndị otu Nnamdi Kanu enwetala 'bail'

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka a hapụ ndị otu Nnamdi Kanu nọ na nga kamgbe afọ atọ n'ọnọdụ bekee kpọrọ 'bail'.

Ọkaikpe Binta Nyako kwuru na ọ na-ahapụ ha na bail maka ọnọdụ ahụike ha nakwa afọ ole ha nọrọla na nga.

O kwuru na ọ bụrụ na ikpe maa ha, na ha kwesịrị inweta ihe ruru afọ ise maọbụ asaa, mana ha anọrọla afọ atọ.

Image copyright Getty Images

Cheta na Ọkaikpe Nyako nyere iwu ka a ghara ikpekọta ikpe Kanu na ndị otu ya n'ụbọchị Febụwarị 20, 2018, maka na amaghị ebe Kanu nọ gbochiri ọganihu ikpe ha.

Mmadụ anọ a hapụrụ bụ Bright Chimezie, Chidiebere Onwudiwe, Benjamin Madubugwu na David Nwawuisi, bụcha ndị otu Ipob.

Nyako kwuru na otu n'ime ha bụ Chimezie nwetaburu 'bail' n'ọnwa Mee nke 2017, mana ndị DSS ji ya oge ahụ jụ ịtọghapụ ya.

Ọnọdụ 'bail' o nyere ha bụ ka ha kpọta mmadụ abụọ bụ ndị akaebe ga-enwe nde naịra 10, nakwa ka ha ghara ịgwa ndị ntaakụkọ okwu maọbụ sonye na nzukọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ha ga na-agakwukwa ndị kọmishọna ndị uweojii nọ na steeti ebe ha bi, kwa izu abụọ.

Gịnị ga-eme Abaribe echi?

Image copyright Getty Images

Omeiwu Enyinnaya Abaribe a ga-anọ n'ọchị ka ọ bụ akwa echi?

Echi bụ ụbọchị ndị ụlọikpe kwuru sị ya kpọpụta Nnamdi Kanu ma ọ bụ ọ takwute ya aja.

Cheta na ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya nyere iwu n'ikpe o kpere n'ọnwa Maachị afọ 2018 ka onye omeiwu Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ gbaara Nnamdi kanu akaebe, kpọta ya ụlọikpe oge a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa Juun ma ọ bụ ha agaa mkpọrọ.

N'akụkọ mba ofesi

Image copyright Reuters

Ndị ọrụ nchekwa si mba Amerịka bụ FBI erutela Itiopịa ebe ha ga-enye aka ime nyocha ogbunigwe gbapụrụ ma merụọ ndị mmadụ ahụ ụbọchị ole gara aga.

N'otu aka ahụ, otu onye na-echekwa onyeisiala ndị Zimbabwe anwụọla site n'ahụ ọ merụrụ ka ogbunigwe gbara ebe onyeisiala Emmerson Mnangagwa na-ekwu okwu ụbọchị abụọ gara aga.

N'egwuregwu,

Ureguwa ji ọkpụ goolu atọ merie ndị na-ele ọbịa asọmpi Iko Mbaụwa bụ Rọshịa.

Ebe ndị Sawudi Arebia ji ọkpụ goolu abụọ merie Ijipt, nke bụ na Ijipt apụọla n'asọmpi a.

Gee nkeji nke abalị a ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Otu nwoke a kpọrọ Festus Ijeomah na nwanne ya nwoke gara n'ụlọọrụ ndị FRSC nke e ji 'Road Safety' mara, ebe ha gosipụtara iwe ha maka ụgbọala ya ndị FRSC kpọkasịrị kemgbe afọ 2017.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOtu nwoke kọwara etu ndị FRSC si daa iwu ha hibere

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a