Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Brazil na Meziko na ndị ọzọ ga-asọmpi taa

Ndị ga-ama aka mgba n'asọmpị iko mba ụwa taa

Image copyright Getty Images

N'asọmpi Iko Mbaụwa, ndị ga-asọmpi taa bụ Brazil na Meziko n'elekere atọ nke ehihie.

Beljọm na Jaapan ga-asọ mpi ha n'elekera asaa nke abalị a.

Obi ka na-agbawa ndị na-akwado Spen makana Rọshịa agbapugo ha na ya bụ asọmpi.

Rọshịa jiri ọkpụ goolu anọ a satara atọ wee merie Spen na penariti.

Onya na onye ga-asọ mpị na Wimbledon taa?

Image copyright Getty Images

Roger Federer na Dusan Lajovic ga-asọ mpi n'egwuregwu tennis nke a kpọrọ Wimbledon Open taa.

Akụkọ na-ekwu ugbua na ọ dịka Serena Williams ga-eso n'asọmpi ahụ.

Akwụkwọ ntuliakaadigboroja ọpụtaala?

Image copyright Getty Images

Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC ekwuola na ha na-enweta akụkọ gosiri na o nwere ndị chọrọ ime akwụkwọ ntuliaka adigborojaa na-ere n'elu intaneti.

Inec kwuru na ha na ndị nchekwa obodo dị icheiche na-enyocha akụkọ a ugbua.

Image copyright LASEMA

Gọọmentị Legos steeti enyeela ndị na-anya ụgbọala na-ebu mmanụ ugbọala ụbọchị iri atọ ịnata akwụkwọ gosiri na ụgbọala ha na-aru ọrụ nke ọma.

Mkpebi a bụ maka ihe mberede mere n'izu uka gara aga oge otu ụgbọala bu mmanụ gbara ọkụ ma gbuo mmadụ itoolu n'akwa mmiri Otedola n'ime Legos steeti.

Lee onyeisiala ọhụrụ nke ala Meziko

Image copyright Getty Images

Andrés Manuel López Obrador ga-abụ onyeisiala Meziko ọhụrụ.

Ndị ọrụ ntuliaka kwuru na ha ka na-agụ akwụkwọ mbinye aka mana Obrador ejirila ọkara merie na nke ha gụrụ ugbua.

Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Ihe onyonyo nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤmụ m ndị na-enye m nri anọzịghị ndụ