Akụkọ kachasị na'abali a: 'Oke idemmiri na-abịa, kee nkwụcha - NEMA

'Oke ide mmiri, ke nkwụcha' - NEMA

Image copyright Getty Images

Onyeisi ndị ụlọọrụ otu gbatagbata nke a kpọrọ 'National Emergency Management Agency' na bekee nke mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Walson Ibarakumo adọọla aka na nti ka ndị bị na mpaghara ahụ kee nkwucha maka na oke ide mmiri na-abịa.

N'akụkọ nyiri ibe ya, otu a kpọrọ Igbo Environmental Foundation ekwuola na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nwere mbize karịrị puku abụọ na narị asatọ nke nwere ike ịchụsa obodo dị iche iche na mpaghara ahụ.

Ha ga-achụda Buhari n'ọkwa?

Image copyright Getty Images

Ụlọikpe ukwu dị n'Osogbo enyela ụlọomeiwu iwu ka ha bido ozugbo ozugbo usoro ịchụda Muhammadụ Buhari n'ọkwa onyeisiala nke a kpọrọ 'impeachment na bekee.

Oke ogbugbu mmadụ ga-emebiri Buhari ntụliaka 2019 - Ndị Bishop Katọlịk

Image copyright Getty Images

Ọgbakọ ndị Bishọp ụka Katọlịk na Naịjirịa a kpọrọ, 'Catholic Bishops Conference of Nigeria (CBCN),' ekwuola na nkiti onyeisiala bụ Muhammadu Buhari gbara maka oke ogbugbu ga-emebiri ya ihe na ntụliaka na-abịanụ.

Ndị Nigerianlivesmatter emeela ngagharịiwe n'Abuja

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Katọlik mere ngaghariwe megide oke ogbugbu mmadụ na Legos na nsonso

Ụmụafọ Naijiria na ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye pụtara n'igwe na Unity Fountain dị n' Abuja mee ngagharíiwe iji igosi iwe ha banyere oke ogbugbu mmadụ na-eme n'akụkụ Naijiria dị iche iche.

Sarakị chọrọ ka ụlọomeiwu steeti 36 kwado uweojii steeti

Image copyright @BUKOLASARAKI

Onyeisi ndị omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki arịọla ndị ụlọomeiwu nọ na steeti iri ató na isii na Naijria ka ha tinyere aka na ndezigharị iwu ala Naijiria ka e nwe ndịụwe ojii nke steeti.

Emmanuel Macron enyeela Afirika ndụmọọdụ

Image copyright Getty Images

Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron biara njem na Naịjirịa ugbua, na-ekwusi ike na ụlọọrụ otu EU ga-emepe na Afríka maka ndị mbiambia ga-eme nke ọma ma ọ bụrụ na gọọmentị ndí mba nó n' Afríka tinye aka na ya bụ ọrụ.

Onweghị ihe gbasara anyị na Kylain Mbappe

Image copyright Getty Images

Otu Real Madrid ekwuola na akụkọ kwuru na ha ga-azụ ọgba bọọlụ Kylain Mbappe abụghị ezi okwu ncha ncha.

Gee akụkọ anyị ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ekwere m na 'One Nigeria' ma ụmụ Igbo gaanụ mepe ala Igbo'