Maersk MD: Gịnị ka ị kwesiri ima tupu ị nabata onye odibo
Onye bụ onye ahụ ị chọrọ ka ọ bụrụ onye enyemaaka n'ulọ gị?
Akụkọ dị iche iche na-apụta n'oge gara aga gosi etu ndị nyemaaka na-atọ ụmụaka maọbụ ya na ha a na-eme mmekọrịta ahụ.
N'ọnwa Disemba n'afọ 2014, otu nwaanyị aha bụ Juliet bụbu onye enyemaaka tọrọ ụmụnwata abụọ n'otu ezinaulọ biri na Magodo na Legos steeti.
- Ị ma ọrụ ndị ụmụnna na otu anọ ọzọ kachasị mkpa n'ala Igbo?
- Ihe 7 ị ga-eji cheta ndị Naịjirịa ma ị zute ha n'ụgbọelu
Nne ụmụaka aha ya bụ Onajite Esharegharan gwara ndị uweojii na ya nụrụ maka onye nyemaaka n'elu webusait a kpọrọ OLX.
O nwekwara ụmụaka abụọ ndị odibo tọrọ na Shagamu, ọzọ bụkwa ụmụaka atọ a tọrọ na Shasha na Legos.
Mary Akinloye bụ onye nyemaaka ha tọrọ oge ahụ kpọrọ nne na nna ụmụaka n'elu ekwe ntị na-ajụkwa ha maka ego ntọhapụ ruru nde naira 15.
O bụ oge okwu pụtara ka ndị uweojii dọrọ ndị nne na nna aka na ntị na ọ dị ezigbo mkpa ka ha maa maka onye ga-abụ nyemaaka na bee onye ọbụla.
Mana maka ụwa sị dị ugbua, ọtụtụ ezinaụlọ na-achọ onye ga-abụ onye nyemaaka n'ezinaụlọ ha.
Ihe niile diri mkpa ma ị na-achọ onye nymemaaka
BBC Igbo gbara otu nwaanyi aha ya bụ Joke Afolabi bụ onyeisi ụlọọrụ na-ezipu ndị ọrụ nyemaaka a kpọrọ 'Conciege and Home Care Services' ajụjụọnụ gbasara okwu a.
Afolabi kwuru na ọ bụ eziokwu na ụlọọrụ ha na-ezipu ndị mmadụ dịka ndị nyemaaka gawa ụlọ dị iche iche mana ha na-agba mbọ hụ na ndị niile a tinyere n'ọrụ bụ marị ihe a chọrọ n'ụwa.
Onye ọzọ aha ya bụ aha bụ Christanah Akindolie bụ onye ọrụ ndụmọọdụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ dị ezigbo mkpa ka ị bụrụ onye na-edo anya, onye nwere ọchịchọ ịmata ihe niile.
Ajuju asaa ịkwesiri ịgba onye ọbụla chọrọ ịbụ onye nyemaaka gị
1. Gịnị mere i ji hapụ ebe ị na-arụ n'oge mbu?
Ọ na-eme nkọwa a, lee anya ka ị mara n'okwu ya ọ na-adaba.
2. Ebe ka i si bịa? Onye bụ nne na nna gị? Ezinaụlọ gị?
3. Nata ya aha na akara ekwenti onye ọ rụrụ ọrụ n'aka ya tupu ọ bịa na nke gị.
4. Lee uda olu ya nakwa omume ya mgbe ọ na-asa gị okwu.
5. Nye ndị uweojii aha ya, ka ha nyocha ọfụma mara ma ọ bụ onye nupuru isi n'iwu, maọbụ onye ha na-achọ achọ.
6. Kpọrọ ya gaa ụlọọgwụ ka ha nyocha ya, ka ha mara ma ọ dị ime, maọbụ o nwere ọrịa mmịnwụ(HIV), ịba ojii (hepatitis) nakwa ụkwaranta (tuberculosis.)
Ha nyochakwa ụdi ọbara dị ya na-ahụ(blood group) maka adịghị a ma ama.
7. Lebanye anya na ndị kwudoru ya dịka onye akaebe.
Akụkọ ga-amasị gị