Ibrahimovic na David Beckham a na-emekwu 'betting'?

Beckham na Ibrahimovic

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Beckham na Ibrahimovic gbakọrọ bọọlụ ọnụ n'otu PSG dị na mba Frans n'afọ 2013

Onye bụ ọkachasị nye goolu na Swidin bụ Zlatan Ibrahimovic, gwara onye bụbụ onyendu ndị otu egwuregwu bọọlụ Ịngland bụ David Beckham ka ha maa aka maka asọmpị ndị Ingland na Swidin tata.

"Yo David Beckham," Ibrahimovic, bu onye gbara bọọlụ na Man U dịka Beckham kwuru.

"Ọ bụrụ na Ịngland merie, a ga m egonye gị nri ebe ọbụla ị chọrọ. Ọ bụrụ na Swidin merie, ị gonye m ihe ọbụla m chọrọ n'akea. Ị nụgọ?" (Ikea bụ ụlọ ahịa oche na ngwa ụlọ)

Beckham sara ya sị na ọ bụrụ na Swidin merie, ọ ga-akpọrọ Ibrahimovic gaa zụtara ya ihe ọbụla ọ chọrọ maka ụlọ ọhụrụ ọ na-achọ ịkwaba n'obodo Los Angeles.

Mana, o kwukwara na ọ bụrụ na Ịngland merie, Ibrahimovic ga-abịa ọgbọ egwuregwu Wembley soro ya kirie asọmpi, ma taa azụ na ji e ghere eghe ebe o yi uwe ndị Ịngland.

Ihe ndị mmadu na-ekwuzi ugbua bụ onye ga-emeri n'etiti mmadụ abụọ a?

@brendan_toner kwuru sị na ọ na-eche ka ọ mara onye ga-emeri ịma aka a dị n'etiti Ibrahimovic na Beckham.

@ektaylor64 na-akọwa na Ịngland ga-emeri, ma kwuo na Beckham ga na-enye Ibrahimovic nnu o ga-eji ata azụ n'ọgbọ egwuregwu Wembley.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Beckham na Ibrahimovic gbakọrọ bọọlụ ọnụ n'otu PSG dị na mba Frans n'afọ 2013

Etu Ịngland si akwado egwuregwu taa

Onye ndu otu Ịngland bụ Harry Kane, kwuru sị na "agụrụ bọọlụ dị anyị n'ahụ maka abalị nke ọzọ anyị meriri. Mgbe ị si n'ụdịrị agha ahụ pụta, ọ na-enye gị ike pụrụ iche nakwa nkwenye ịga mee ya ọzọ.

Ọ ka na-agụ anyị agụrụ. Ọ masịrị anyị etu o si emetụta anyị. O mechaa banye penariti, anyị ga-adị njikere maka ya. Anyị dị njikere ime ihe ọbụla ọ ga-ewe."

Ịngland na Swidin ezutela onwe ha n'egwuregwu bọọlụ ugboro 24. Ikpeazụ ha zukọrọ n'asọmpi Iko Mbaụwa bụ na Jamini 2006, ebe ha gbara 2-2 n'agba nke otu (group stages).

Akụkọ ndị ga-amasị gị: