Ebidola usoro ichutu osote gọvanọ Imo steeti n'oche - TOE Ekechi

Eze Madumere Image copyright Channels TV

N'oge na-adịghị anya, Eze Madumere bụ osote gọvanọ Imo steeti nwere ike ịbụ onye na-enweghị ọrụ ọzọ.

TOE Ekechi gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ụlọomeiwu nke Imo Steeti na-akwado ichutu Madumere.

Akụkọ kwuru na ndị omeiwu na-ebo Madumere ebubo oke nrụrụaka.

Maka nke a, e hibere kọmitii mmadụ isii ga-etinye uchu n'inyocha ebubo ndị a e boro ya ma gwakwa ndị ụlọomeiwu n'ime ụbọchị asaa.

Gee ihe Ekechi nwere ikwu gbasara ihe a n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu e si chọọ ichutu Eze Madumere n'oche osote gọvanọ Imo steeti