Nkwado Ngige atọgbuola Fayose

Ebe foto si, Chioma Obianinwa
Ngige enyi m, imela!
Ngige ọ na-akwado Fayose?
Chris Ngige ọ kpachara anya kwado Ayodele Fayose kama Kayode Fayemi na nkwado ntuliaka ha nwere n'Ekiti?
Akụkọ ruru anyị aka sị na n'ebe ha gara ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị n'Ekiti steeti, Ngige kwuru sị "ị lụọ nwunye abụọ, ị ga-ama nke ka mma. Fayose bụ nwunye nke ka mma."
Lee ihe nkiri ebe o kwuru ya:
Mana na-etufughị oge, Fayose ekelela Ngige maka nkwado o nyere ya n'igwe twita.
N'akụkọ ndị ọzọ, Osote gọvanọ Imo steeti ọ ga-apụ?
Ebe foto si, Channels TV
Ndị ụlọ omebeiwu nke Imo steeti bidoro usoro ichutu osote gọvanọ Imo steeti bụ Eze Madumere n'oche taa.
Akụkọ a kwuru na e nyela Eze Madumere akwụkwọ ozi e ji achutu ya n'oche osote gọvanọ Imo steeti.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: A ga-achutu osote gọvanọ Imo steeti taa?
N'etiti APGA na CUPP
Ebe foto si, WillieObiano/Facebook
Willie Obiano bụ Gọvanọ Anambra steeti bụ onye otu APGA
Victor Ike Oye bụ onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA gwara BBC ihe mere APGA ejighi sonye n'otu ọhụrụ CUPP.
Ọ sị na ọ bụghị iwu na pati niile ga-esonye na nke ọhụrụ ahụ.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Etu APGA si gbalahụ isonye na CUPP
Akụkọ si mba ọzọ
Ebe foto si, Thai Navy
A kpụtachaala mmadụ iri na atọ ahụ tọrọ n'ime ọgba na mba Thaịland.
N'aka ọzọ, otu Manchester United akpọọla oku sị na ha chọrọ ka ụmụaka a na onye nchịkọta ha bịa n'ọgbọ egwuregwu ha bịa legharịa anya ma ha gbakee ọfụma.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ụmụaka 12 na onye nchịkọta ha apụtala n'ọgba Thailand
N'egwuregwu
Fernando Torres bụ onye a ma dịka dike n'egwuregwu bọọlụ agafeela mba Japan ebe ọ ga-ebido ịgbara ndị otu Sagan Tosu.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
BBC Nkeji
Lee ihe nkiri nke taa
Ode akwụkwọ Chimamanda Adichie si na okwu na a na-emegide Igbo na Naịjirịa nwere eziokwu n'ime ya, mana ọpụpụ abụghị ihe ga-agwọ ya.
Okwu Chimamanda maka Biafra na Ipob