Akụkọ kachasị mkpa taa: Beljọm agbawaala obi Ịngland

Beljọm bụ mba atọ kachasị agba n'asọmpi iko mbaụwa

Image copyright Getty Images

Obi agbawaala ndị mba UK ugbua ka Belgium siri ji ọkpụ abụọ na asataghị ihe nwe merie ha n'asọmpị iko mba ụwa ha gbara ta na Rọshịa.

Mmerị a pụtara na Beljọm bụ zi mba nke atọ kashachị agba n'asọmpi a.

France na Kroatia ga-asọmpị nke ikpeazụ n'elekere anọ nke abalị, echi.

Ngagharị iwe maka Trump abaala ụbọchị atọ

Image copyright Getty Images

Ngagharị iwe ha na-eme n'ala UK maka onyeisiala Amerika bụ Donald Trump abaala ụbọchị atọ

Puku kari puku mmadụ pụtara n'ọgbọ egwuregwu golf Trump dị na Skọtland na -asị ya ntọọ.

Iwe ha bụ na ha ekweteghị n'iwu di icheiche pụtara n'aka Trump dịka iwu gbasara ndị mbịambịa na kwa nke a kpọrọ 'Paris Agreement' n'Bekee.

Ihe mere na ntuliaka Ekiti taa

Image copyright Getty Images

Ndị bi n'Ekiti steeti pụtara taa ịme ntụlịaka ha ji ahọpụta onye ga-achị dịka gọvanọ ọhụrụ nke steetị ahụ.

Ugbua ndị ọrụ INEC na-achịkọtọ akara ọgụgụ ntụlịaka na ward dị icheiche.

Mana ndị ntaakụkọ BBC nọ ọrụ n'Ekiti kwuru ọgbaghara batara n'ọfọdụ obodo chọrọ iyasa ya bụ emume.

Ambode azọpụtaala ndị Naịjirịa toro na Rọshịa

Image copyright Getty Images

Otu onye Naịjirịa bi na Rọshịa aha ya bụ Kehinde Oluremi gwara BBC Igbo na aka na-achị Legọs steeti bụ Akinwumi Ambode kwụrụ ụgwọ iji kpọlata ụmụ Naịjirịa iri ise tọọrọ na Rụshịa.

Cheta na akụkọ pụtara ụnyaahụ na ndị aghụghọ ghọgburu ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa gara Rọshịa maka Iko Mbaụwa n'iresị ha akwụkwọ njem ezụghị ezụ.

Gee akụkọ anyị nke abalị a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwata a mịrị paịntị ọbara anọ n'otu ọnwa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị