Katsina: Uzọ ise ị ga-esi gbalahụ oke idemmiri

Lezie anya ebe ibi maka ụzọ ide mmiri si achife. Image copyright Getty Images

Ihe karịrị mmadụ iri anọ (44) nwụrụ, ebe ụlọ narị ise (500) bụ ihe dakpọrọ n'ihi oke idemmiri wakporo Katsina steeti.

Oke ọdachi ahụ mere n'ụbọchị Monde bulitere mkpa ọ dị ndị Naịjirịa ichekwa onwe ha iji gbalụ ụdị ọdachi a.

Dịka ọkammụta n'ihe gbasara igwe nke a na-akpọ ('Geographic Information System' -GIS) na bekee nke ụlọọrụ National Expert na bekee nke siri kọwa, bụ Anthony Okenwa ide bụ ọdachi si na chi na-eme ma oke mmiri ọzụzụ zoo n'obere oge maọbụ na mmiri tofee oke osimiri.

"Oke mmiri ọzụzụ na nwa oge nwere ike ibute oke ide mmiri. Mmiri si oke osimmiri tofee nwekwara ike ibute oke idemmiri."

Dịka Okenwa siri kọwa, ihe na-ebute ihe ndị a bụ mgbanwe igwe nke a kpọrọ 'climate change' na bekee na oke owuwu ụlọ n'ihi mmepe obodo.

Lee azụ ise Okenwa tụpenyere gị banyere ka ị ga-esi chekwa onwe gị na ezinaụlọ gi n'ebe oke ide dị:

1. I mee ka ọwa mmiri basaa

'Ịkpọchapụ aja maọbụ ahịhịa n'ọwa mmiri ka idemmiri were hụ ụzọ e sị aga nakwa ịwasa ọwa mmiri ka ọ bụkwa ibu.'

2 Ikunye osisi

Osisi bụ ihe mgbochi nye idemmiri. Ịkụ osisi na-enye aka n'igbochi idemmiri.

3. Kwapụ ma i biri n'ọwa mmiri ide

Nkenke aha onyonyo Oke idemmiri gburu ihe karịrị mmadụ iri anọ na Katsina

"Mmiri ide nwere ebe o si ehute nwekwa ebe ọ na-ehuga.

Ọ bụrụ na ibi na ndagwurugwu ebe mmiri ide na-adọ ma oke mmiri zọọ, kwapụ."

4. Lebanye n'ihe gbasara ọwa mmiri ma ị na-azụ maọbụ na-arụ ụlọ

Oke iwu ụlọ na ihe ewumewu ndị ọzọ n'eleghi anya n'azụ so n'ihe na ebute nsogbu oke idemmiri.

Ị chọrọ ịrụ ụlọ, gbaa mbọ hụ n'ụlọ gị anọchịghị ọwa mmiri. Nyekwa ohere maka ọwa mmiri ga-esi na-aga.

5. Gọọmenti ịhazi atụmatụ ị mara ndị mmadụ ọkwa ịdemmiri na-abịa.

Agha a kara aka anaghị eri ngwụrọ. Dịka Okenwa siri kọwa, "ọ dị mkpa na gọọmenti nwere ụlọọrụ na-agwa ndị mmadụ oke a ga-enwe oke idemmiri ka ha weere kee nkwucha."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara