Anyị dọpụtara ụfọdụ mmadụ ebe ụlọ ha dagidere ha- Waziri

idemmiri Katsina

Mmadụ ruru iri anọ na itoolu nwụrụ na Jibiya dị na Katsina steeti ụnyaahụ bụ Monde ka oke idemmiri wakporo ha.

Oke idemmiri ahụ nke so mmiri ozuzu kwadakwara ụlọ ebe obibi ruru narị ise.

Akụkọ kwuru na oke mmiri ozuzo mere na mmiri dị nobodo ahụ tofee ikpere mmiri ma wakpo ndị obodo ahụ.

Onyeisi ụlọọrụ gbatagbata gọọmenti a kpọrọ Katsina state emergency management agency bụ Aminu Waziri gwara ụlọrụ ntakụkọ AFP na ha ahụla ozu mmadụ 49.

Ka ọ dị ugbua, onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari akasiela ndị ọdachi dakwasiri obi.

O kwuru na ya enyela ụlọọrụ gbatagbata NEMA iwu ịgbatara ndị ihe metụtara ọsọ enyemaka.

O siri: " Dịka ọrụ ịgbapụta ndị ihe mere na-aga n'ihu, ezinaụlọ, gọọmenti na ndị Naịjirịa na-eti ụnụ aka n'obi."

Isiokwu Ndị Emetụtara