Idemmiri Katsina: Nwaanyị lụrụ di na Fraide, lọkwute ya na Satode, mmiri eburu ya ụbọchịụka

Oke ide
Nkọwa foto,

Oke idemmiri gburu ihe karịrị mmadụ iri anọ na Katsina

Akụkọ arịrị na obi mwute na-eso ọdachi oke idemmiri mere na Katsina steeti dịka ndị ihe metụtara ka na-agụkọ ihe ọ pụrụ ha.

Ọtụtụ ndị mmadụ tufuru di ha, nwunye ha, ụmụ ha nakwa ihe ndị ọzọ ha nwere.

Otu nwaanyị gbakwara akwụkwọ ụbọchị Fraiday ma soro dị ya lọta na Satọde mana idemmiri napụrụ di ya nwunye ọhụrụ ya.

Ndị gara agbamakwụkwọ ha gwara BBC na akụkọ nwaanyị ahụ wutekarịrị ha n'akụkọ mkpamkpa kpara n'obodo ahụ.

Na nso nso, oke idemmiri gburu ihe karịrị mmadụ iri ise(50) na Jibiya dị Katsina steeti.

Otu nwoke nwa ya nwaanyị dị ọnwa atọ tụrụ arịrị na ọ bụghị naanị na mmiri buru nwa ya, na otu foto ọ kara iiji echeta ya dị n'ime ekwenti o jiri seta ya so n'ihe ndị idemmiri buru.

"Ugbu a onweghị ihe m ga-eji na-echeta nwa m n'ihi na mmiri eburula ekwenti m."

O nwekwara nwaanyị ajadu ya na ụmụ ya atọ tọrọ n'ụlọ ha. Ndị agbata obi gbalịrị inye aka zọpụta ha mana ide buru ha bufuo.

Ka ọ dị ugbua, gọọmentị na ndị otu na abụghị gọọmenti agbatarala ndị ihe mere ọsọ enyemaka mana ndị obodo na ekwu na enyemaka ha ezughị ọnụ.