Na Zamfara steeti, mmadụ ruru 27 anwụọla na mwakpo ndị ohi ehi

Ọchi-ehi na ehi ya Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Na Zamfara steeti, nsogbu ndị ohi ataala isi ọtụtụ mmadụ na ọtụtụ ehi

Ndị bi n'okpuru ọchịchị Maradun na Zamfara steeti nọ n'ime iru ụjụ dịka ndị na-ezu ohi ehi wakporo imeobodo ise ma gbuo mmadụ ruru 27 ma merụọ 10 ahụ.

Otu onye bi na Gidan Goga, otu obodo so n'ime ise ahụ ndị ohi-ehi wakporo bụ Makau Malikawa kwuru n'ezie na ndị omekome ahụ wakporo ime obodo ise, merụọ mmadụ iri ahụ.

Malikawa kwukwara na otu n'ime mmadụ iri ahụ merụrụ ahụ nwụrụ n'ụtụtụ taa(Tọzde), ebe ndị ụfọdụ ka nọ n'ụlọọgwụ ịnata nleta.

Ọ gara n'ihu kwuo n'obodo ndị ihe a metụtara tọgbọrọ chakoo ugbua, n'ihi na ndị mmadụ gbara ọsọ maka ndị mwakpo ahụ ndị gbara ụfọdụ ụlọ ọkụ kwuru na ha ga-abịa ọzọ.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ SP Muhammad Shehu kwuru na akụkọ na mmadụ 30 nwụrụ na steeti ahụ n'ime mwakpo ahụ bụ okwu ụgha.

Shehu kwuru na ọ bụ naani mmadụ atọ nwụrụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

O kwukwara na ọ bụ imeobodo abụọ ka a wakporo.

O kwuru na ndị uweojii menyụrụ ọkụ nsogbu ahụ n'obodo Danjoni ebe ha chụrụ ndị omekeome ahụ ụkwụ ete aja.