Akụkọ kachasị n'abalị a: Ụmụakwụkwọ sekọndịrị na-aga China maka asọmpi Rọbọt

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Obere ọgbaghara dara n'ụlọomeiwu sineti taa maka aha onyeisiala Buhari wetara onye ga-abụ onyeisi ụlọọrụ na-arụzị ụzọ gọomenti etiti a kpọrọ Ferma.

Image copyright @NGRSenate

Sineto Ike Ekweremadu weliri olu kwuo na onyeisiala Buhari anaghị eso usoro iwu inye mpaghara niile ọrụ ebe ọ na-ahapụ ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Naịjirịa

Ụmụaka Naiịjirịa a na-eme ihe siri ike!

Image copyright Getty Images

Ụmụaka akwụkwọ sekọndịrị atọ ga-aga China maka asọmpi gbasara mmepụta nka na ụzụ 'Róbọt a na-akpọ World Robotic Competition na bekee.

Akụkọ mba ofesi

Na mba ofesi, onyeisiala mba Rọshịa Vladamir Putin anaghị achịkwa?

Image copyright Getty Images

O na-acha ndị niile na-akatọ ọgbakọ ya na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump chọrọ ime ọkụ.

N'akụkọ ndị ọzọ,

Onye ọkpaọchị Trevor Noah aghọrọla ada maka okwu o kwuru na Afrịka meriri asọmpi Iko Mbaụwa.

Otu onye welitere isi na France katọrọ Noah maka okwu ahụ nke o kwuru na-agụpụ ndị sọrọ mpi ahụ dịka ndị Frans

Mana Noah zọrọ isi onwe ya si ka onye na-akatọ okwu ya buru ụzọ ghọta na ya anaghị agụpụ ha na France ma na ọ bụ ịgụnye ha na Afrịka.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu