Ndị ojiegbeezu awakpoola ebe obibi n'Ọnịcha

ụmụnwaanyi uweojii nke Naịjirịa Image copyright Getty Images

Ndị ojiegbeezu a na-amaghị ndị ha bụ ruru mmadụ 20 wakporo otu ebe obibi ndị mmadụ n'Ọnịcha, Anambra steeti taa bụ Tọọsde ma gbuo otu onyenche ha.

Ndị omekome ahụ merụkwara otu onyenche ọzọ ahụ.

Otu onye hụrụ ihe mere gwara ndị ntaakụkọ na oge ndị omekome ahụ batara ogbe ebe obibi ahụ, ha chụwara ndị nche ha ọsọ na-agbakasị egbe rue mgbe ha gbaturu otu onye ma gbuo ya.

Otu onye gwara ụlọntaakụkọ 'Thisday' na a chọtara ozu otu onye nche aha ya bụ Friday Atta oge ndị oji egbe ahụ lara ebe onye ọzọ bụ Uche Kalu gbajiri ụkwụ abụọ na ukwu ya.

N'okwu ya: "Ebe a dịka ebe a na-alụ ọgụ oge na-adịghị anya.

"Ndị omekome a ji ụdị egbe dị icheiche we bịa, a hụrụ m Ak 47 mana ndị nche anyị ejighi ngwọagha ọbụla maka na a gwala ha ejizila egbe.

Ọ gara n'ihu kwuo; "Anyị nọ na nsogbu n'akụkụ ebe a anyị bi, agụlighi m ndị meruru ahụ mana ama m na ha karịrị mmadụ 20.

"Nke abụghịkwa mbụ ndị a na-awakipo anyị ebe a."

Onyeisi ogbe ahụ bụ Uche Okeke gara na nke ndị uweojii n'Ọnịcha ime mkpesa ebe ọ gwara ndị ntaakụkọ na nke a bụ ugbo atọ ndị a na-awakpo ha."

O kwuru na ha na-ebi n'ụjọ kamgbe ha kwabatara ebe ahụ; "Anyị zụrụ ala site n'obodo Umuonuorah Amuche dị na Nkwelle Ezunaka mana kamgbe afọ 2014 na 2015, ndị ntorobịa si Osile na-enye anyị nsogbu na ha nwe ala ahụ.

"Anyị agwala ndị anyị gọrọ ala ahụ n'aka ha, ha egosi anyị ikpe ụlọikpe kachasị ukwu kpere iji kwuo na ala ahụ bụ nke ha na-abụghị nke ụmụntorobịa anụ ma kwuo ka ha kwụsị imekpa anyị ahụ kama ha gakwuru ndị rere ala ahụ."

O kwuru na ha edegarala kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ akwụkwọ site n'aka onye ọkaiwu ha mana enwebeghi mgbanwe.

Ha rịọrọ ka onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim idris gbatara ha ọsọ enyemaka ka ndị uweojii n'Anambra jide ndị ahụ ma maa ha ikpe.

Mbọ niile BBC Igbo gbara inweta ndị uweojii Anambra dị ka mmiri a wụrụ n'okwute.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: