AFCON: Flying Eagles enweela nnukwu mmeri
Flying Eagles ga-asọmpị na AFCON

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, otu Flying Eagles emeriela Mauritania ọkpụ ise na-asataghi ihe n'ime asọmpi ga-ahọpụta ndị ga-agba n'asọmpị iko mpaghara Afirika n'afọ 2019.
Nkea pụtara na ha ga-eso n'ime ala dị iche iche ga-asọmpị AFCON n'afọ na-abịa.
Ọ bụ n'ala Niger ka asọmpị a ga-ebido n'ime ọnwa Febuwarị.
Miyetti Allah kwesiri ịza ajụjụ - Gowon

Ebe foto si, Getty Images
Onyechiburu Naịjirịa dịka onyeisiala n'oge garaaga bụ Yakubu Gowon ekwuola na obi gbariri ya agbari maka ọtụtụ mmadụ nwụrụ n'aka ndị na-achị ehi buru egbe na steeti di iche iche n'afọ a.
N'ime ogbakọ Gowon na gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom mere, o kwuru na oge eruola ndị ọrụ nche dị iche iche n'ala Naịjirịa gbara onyeisi ndị otu Miyetti Allah ajụjụ ọnụ ga-akọwa ihe mere udi ihea na-eme n'ala a.
O'diakpo Obire apụọla na APC

Ebe foto si, O'diakpo Obire facebook
Akụkọ pụtara na Delta steeti ugbua na-ekwu na O'diakpo Obire bụbụ onye na-azọ ọkwa ọchịchị dịka gọvanọ Delta steeti n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC ahapuọla patị APC gawa otu Progressive Peoples Alliance.
Obire kọwara na ọ hapụrụ APC Delta steeti maka ọtụtụ nsọgbu na-emebi ihe n'ime patị a na steeti ahụ.
Okpomọkụ na-egbu nmadụ na Japan

Ebe foto si, Reuters
Gọọmentị ala Japan na-adọ ndị ala ha aka na ntị ka ha zọ ishi ha maka nnukwu okpomọkụ na-egbu mmadụ ugbua n'ala ahụ.
Akukọ pụtara n'ala ahụ ugbua na-ekwu na mmadụ ruru iri atọ anwụọla maka okpomọkụ a.
Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị
Nwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu